Atiku Abubakar Address: ihe iri Atiku kwuru taa n'ozi ọ gbasara

Atiku Abubakar Image copyright @Atiku
Nkenke aha onyonyo Atiku Abubakar, onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP bụbu Osote onyeisiala n'ọchịchị Olusegun Obasanjo

Atiku Abubakar, onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu pati PDP gwara ọha Naijiria okwu taa ebe ọ nọrọ rịọ do, do, do ka ha pụta mee ntuliaka ụbọchị Satode na-abịa.

Lee ọkpụrụkpụ ọkwụ ndị si n'ọnụ Atiku pụta:

1. Agaala m na mpaghara dị icheiche na Naijiria ebe m gwara ụmụ Naijiria n'ogbe ụnụ ebumnobi m gbasara ime ka Naijiria gawa kwa n'ihu ọzọ

2. Achọrọ m ịgba ụnụ ume ka ụnụ pụta tụọ vootu ụbọchị Satode na-abịa bụ Febụwarị 23

3. Vootu ọbụla dị mkpa

4. Ọ bụrụ na ị tụghị vootu, ihe i na-ekwu bụ ihe dịrị etu ọ dị ugbua

5. Ọdịnaihu Naijiria dị gị n'aka

6. Ike ime ka Naijiria gawakwa n'ihu ọzọ dị n'akwụkwọ ntuliaka gị

7. Atụfula ike gị a site na ịnọrọ n'ụlọ

Image copyright @Atiku

8. Ekwela ka wuruwuru mee na ị pụtaghị n'ihi na ị pụta, ndị mmadụ pụta n'igwe, wuruwuru agaghịkwa adị ire

9. Ọ bụrụ na i nweghị ọrụ, Satode bụ ụbọchị i nwere ohere ịgbanwe ọnọdụ gị

10. Aga m atụ vootu ụbọchị Satode, pụta soro m tụọ vootu n'agbanyeghị pati ị chọrọ itunyere.

Akụkọ ga-amasị gị: