Nigeria Election 2019: Nigeria ga-ahọpụta onye ga-abụ onyeisiala taa

Onyeisiala Buhari na Atiku Image copyright Getty Images/Atiku

Ndị Naịjirịa ga-aga n'ihu ịhọpụta onye ga-abụ onyeisiala n'ime afọ anọ ọzọ na-abịa.

Cheta na e higharịrị ụbọchị ntuliaka onyeisiala site n'ụbọchị Febrụawarị 16, bufete ya taa bụ Febrụwarị 23.

N'ime ndị na-azọ ọkwa onyeisiala, gụnyere ndị aha ha kacha ada ụda bụ Muhammadu Buhari dị afọ 76, Atiku Abubakar dị afọ 72, Kingsley Moghalu, Omoyele Sowore nakwa Fela Durotoye.

Ebe Buhari bụ onyeisiala ugbua na-ekwu na o meela ka akụnaụba obodo mụbanye, ndị ọzọ na-azọ ọkwa ya na-ekwu na ọ naghị arụ ọrụ ọbụla.

Onye ọbụla meriri na ntuliaka a kwesịrị ime ihe a hụrụ anya banyere enweghị ọkụ latrik, mpụ na nrụrụaka, ọnọdụ nchekwa obodo nakwa akụnaụba obodo.

A ga-ebido ime ntuliaka mgbe ọ kụrụ elekere asatọ nke ụtụtụ a, ma mechie ya n'elekere abụọ nke ehihie.

Mana onye ọbụla ka kwụ n'ahịrị mgbe e mechiri ntuliaka, ka ga-atụnwu vootu.

Odobeghi anya ụbọchị a ga-akpọpụta mpụtara onye meriri; o nwere ike ịbụ ụbọchị mọnde maọbụ toozde maọbụ e mechaa.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a