Imo State Election: 'Ndị otu Rochas tiri m ezigbo ihe ka m kpọọ ya onye mmeri' - Onye ọrụ INEC

Ibeawuchi Izuchukwu bụ onye chịkọtara vootu n'okpuru ọchịchị Ọlụ n'Imo steeti gwara BBC Igbo etu o si gabiga ihe ize ndụ n'aka ndị na-arụrụ gọvanọ Imo steeti ọrụ maka na ya ekwetaghị ka e degharịa mpụtara vootu a tụrụ ebe ahụ.

Izuchukwu gwara BBC Igbo na gọvanọ Okorocha na ndị otu ya jidere ya, nye ya ego ma nye ya iwu ka o degharịa mpụtara ntuliaka ahụ mana oge ya jụrụ ime nke ahụ, ha ejide ya ma mesie ya ike.

Lee ihe o kwuru n'onyonyo a.

BBC Igbo gbara onye ọrụ Rochas, Ebere Nzewuji ajụjụọnụ mana o kwuru na ọ dịka Ibeawuchi natara ndị iro Rochas ego ka o kwuo ihe ndị ahụ niile.

N'okwu ya: "Ihe ndị ahụ o kwuru bụ okwu asị, ọ dịka ọ natara ndị pati ndị ọzọ ego iji kwugide ọga m".

N'aka nke ọzọ, BBC Igbo gbakwara onye ọrụ INEC Imo steeti bụ Odiziakụ Benson ajụjụọnụ mana o kwuru na ihe ahụ ka Ibeawuchi kwuru.

N'akụkụ nke ya, onyeọrụ INEC n'etiti bụ Rotimi Oyekanmi kwuru na ha natara mkpesa gbasara ụfọdụ nsogbu e nwere n'ụfọdụ ebe n'Imo steeti mana ha anụbeghi maka okwu Ibeawuchi.

O kwukwara na onye nchịkota vootu INEC na steeti ahụ erubeghi Abuja ịkọwa ihe mere.

Akụkọ ndị ga-amasị gị