Presidential election 2019: Buhari achakeela ọzọ

Ebe foto si, @BashirAhmaad/Twitter
Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ Inec n'aha ịchafụ ekwuola na ọ bụ onyeisiala Muhammadu Buhari meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala afọ 2019.
Buhari nke APC nwere vootu kachasị dịka o ji vootu dị 15,191,847 tipụ Atiku nke PDP onye nwetara vootu dị 11,262,978 anyammiri n'anya.
N'ịkpọpụta onye meriri, onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru na n'ebe vootu karirị ndị a nabatara ịtụ vootu, na ndịiche dị na ndị a nabatara ịtụ vootu na vootu a tụrụ adịghị nnukwu.
N'okwu ya, Yakubu kwuru na o rughị pasent abụọ.
Onye nnochite PDP bụ Osita Chidoka kwuburu na e nweghị nkọwa ọbụla maka vootu dị nde 1.669.
Ọ kpọrọ oku ka Inec hapụ ịkpọpụta onye mmeri ganye mgbe e nyochara ebe mmiri si banye opi ụgbọgụrụ.
Mana PDP ajụla mpụtara ntuliaka ahụ.
PDP rịọrọ ndị Naijiria ka ha jụ mpụtara Inec wepụtara ma ọ bụrụ na Inec jụ iwepụta ngụkọ nke igwe 'cardi reader.'
Ka ọ dị ugbua, Inec ga-enye ya Buhari na Osote ya bụ Yemi Osibanjo asambodo mmeri n'Elekere Abụọ nke ehihie taa bụ Wenezde.