Ifeanyi Ubah: Ọ pụtala ihe?

Ifeanyi Uba Image copyright Ifeanyi Ubah/twitter
Nkenke aha onyonyo Ifeanyi Uba

Kepukepu a na-anụ maka Ifeanyi Uba bụ onye chịrị ọkọlọtọ YPP baa Sinet n'Anambra steeti apụtabeghi ihe n'ihi na o nwebeghi onye pụtara kpọmkwem sị na ha ahụla ihe ngosi okwu na-efegharị na o sila YPP pụga APC.

BBC Igbo kpọrọ onyeisi oche ndị YPP n'Anambra; bụ Prince Moses Obi, Senator Victor Umeh, Sinatọ ndị Anambra Sentral (Anambra Central Senatorial District) nakwa Emeka Ibe bụ onyeisioche ndị APC n'Anambra, mana ha niile sị na ha anụbeghi maka okwu a.

Ifeanyi Uba bụ onye ji ego achụ nta ego ejiri ụlọọrụ Capital Oil mara.

Amụrụ ya na Septemba n'afọ 1971.

Ọ bụ ọkpara n'ime ụmụ asaa nna ha mụrụ.

Ya amụọkwa ụmụ ise

Ọ gụchaghị akwụkwọ maka na nna ya na nne ya enweghị ego iji zụọ ya.

Mana ọ gara ọzụzụ dị icheiche mgbe ego batawara.

Ifeanyi bidoro Capital Oil n'afọ 2001.

Ọ bụkwa ya nwe Ifeanyi Ubah F.C. , nke na-azabụ Gabros International Footbal Club bụ nke so na-egwu bọọlụ Premiere league Naịjirịa.

Ifeanyi Ubah zọburu ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti n'afọ 2014 na Labour Pati.

Na 2019 Ifeanyi so zoo ọkwa Sinate maka ịnọchite anya Anambra South Senitorial zone na pati YPP.

Inec kpọpụtara ya dị ka onye meriri ya bụ ntulika 2019 maka ịnọchite anya ndị ọgbọnta vootu ha.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a