Oyetola ka ga-anọkwa n'ọkwa ruo mgbe Ụlọikpe kpebiri - Agbakoba

Adeleke gosiri na obi adighị ya etu esi nara ya mmeri ya Image copyright Twitter/@IsiakaAdeleke1
Nkenke aha onyonyo Adeleke gosiri na obi adighị ya etu esi nara ya mmeri ya

Ọnọdụ Ademola Adeleke bụ onye ji ọkọrọtọ PDP were mee ntuliaka nke ndị Gọvanọ n'Osun steeti gbagwojuru ọtụtụ mmadụ anya ụgbụa.

Ebe ọtụtụ na-asị na ya bụ mmeri Adeleke meriri n'ụlọikpe ehibere maka ikpezi okwu dapụtara n'etiti ndị ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ekwuchaa ọgwụ.

Osun Election: Ụlọikpe enyela Adeleke mmeri

Ụlọikpe achụdala sinetọ Aidoko

Image copyright Davido/ Twitter

Nke bụ na onweghi ihe ọ fọrọ ka ya bụ nwanne nna Davido rigoro na ọchịchị.

Ụfọdụ na-ekwu na ụlọikpe ikpe mkpegharị nke Adegboyega Oyetola APC wegara ya bụ ikpe nwere ike ịtụgharị ya.

Osun Decides: A ga m anara APC mmeri m n'ụlọikpe - Adeleke

BBC Igbo kpọtụrụ okaikpe ukwu bụ Olisa Agbakoba ịmata ka ihe siri kwụrụ na ya bụ okwu.

Agbakoba kwuru n'ezie na Adeleke meriri ya bụ ikpe na ụlọikpe, mana Oyetola ewegala ya bụ okwu na ụlọikpe mkpegharị.

Image copyright Agbakoba/twitter
Nkenke aha onyonyo Olisa Agbakoba (SAN)

O kwuru na "iwu nyere Oyetola ohere ịnọ na ọkwa dịka Gọvanọ Osun steeti ruo mgbe ụlọikpe mkpegharị ga-ekpebi ya bụ ikpe."

Image copyright @Gboyega Oyetola

Ọ sịkwa na ọ bụrụ na ya bụ Oyetola emerie na ogogo ahụ na ọ ga-achiri gawa ruo mgbe ọ chizuru afọ anọ ya.

Akụkọ ga-amasi gị

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị ụlọomeiwu Imo steeti a họpụtara ọhụrụ aga-enye Emeka Ihedioha aka n'ịkwalite ọchịchị steeti?

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a