Aka akparala ụkọchukwu,otu nwaanyị maka imetọọ ụmụaka

onye a kụrụ ịga Image copyright Getty Images

Aka ndị uweojii akparala otu ụkọchukwu a kpọrọ Ezuma Chizemdere nke ụka 'Jesus Intervention Household Ministry' Ejigbo,Legọs maka imetọọ ụmụaka ụmụnwoke atọ ma nye ha ọrịa mmịnwụ (HIV.)

Oge a nwụchiri ya, Chizemdere, onye gbaburu ọsọ ka ọ chọpụtara na ndị uweojii na-esi imi n'ala iji nwụchi ya kwuru na ya na-enye ụmụaka ụmụnwoke ndị ahụ puku naira abụọ oge ọbụla o dinara ha.

Ndị agbataobi gbara ama na ha na-ahụkarị ụkọchukwu ahụ kwa ụbọ cchị ka ọ na-asụ akwa akwa ndina rụrụ isii kwa ụbọchị ma ọ kpọbatacha ụmụaka.

N'aka nke ọzọ, a kpụrụ otu nwaanyị dị afọ iri atọ na asaa, akpọrọ Veronica Vincent n'ụlọikpe na Legọs maka ịmetọ nwa nwaanyị dị afọ abụọ n'Idimu dị na Legọs.

Nne mụrụ nwata ahụ na-ekwu na ọhụghị nwa ya were chọọ ya banye n'ọnụmara agbataobi ya bụ Veronica ebe ọ hụụ nwata hụ ma hụwa na ọgọdọ ukwu ya nwere ka ọ dị.

Mgbe nwaanyị ahụ lere ahụ nwa ya ọ hụrụ na mmiri abanyela opi ụgbọgụrụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

O wegara ndị uweojii ozi ndị kpụrụ nwaanyị ahụ eboro ebubo ụlọikpe.