Arsenal vs Napoli: Arsenal asụọla Napoli akwụ n'Emirates

Arsenal

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Arsenal 2 - 0 Napoli

Ka Arsenal na Napoli zutere onwe ha n'ọgbọegwuregwu Emirates, ha gosiri Napoli nke tọrọ fada.

Arsenal gosikwara ihe ha jiri bụrụ ndị dimkpa site n'itinye goolu na mpio ndị Napoli na nkeji 14 e ji malite ya bụ egwuregwu.

Aaron Ramsey nyere ya bụ goolu ebe Kalidou Koulibaly nke Napoli ji aka ya nye onwe ha goolu na nkeji 25.

Mana ya bụ asọmpi abụghị ofe nracha makana ka o ruchara nkeji 35 asọmpi a malitechara, otu abụọ a ka jigidere bọọlụ nhatanha nke a kpọrọ 50:50%.

Arsenal webetara Alex Iwobi na nkeji 67 ka ha ji ya dochie Alexandre Lacazette.

Ebe foto si, Getty Images

Ebe Napoli ritere mpempe akwụkwọ edoedo e ji dọọ Elseid Hysaj aka na ntị maka arụrụala ọ rụrụ na nkeji 46.

Cheta ba Arsenal na Napoli akwatabuola ya mbụ mgbe ha zutere n'asọmpi Champions League n'afọ 2013 na 2014, bụ mgbe Arsenal ji ọkpụ goolu abụọ tie ha mmọnwụ n'ọgbọ egwuregwu nke Emirates.

Napoli jikwa ọkpụ abụọ merikwa Arsenal na nke ha gbara na San Paolo.

Gịnị ga-eme mgbe ha ga-ezute ịgba ụkwụ nke abụọ na be ndị Napoli?

Chel

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Chelsea 1 - 0 Slavia Prague

N'aka nke ọzọ Chelsea na Slavia Prague zutere ma chịpụ ya n'ọgbọ egwuregwu Sinobo dị na Czech Republic.

Chelsea jisiri ike jiri otu goolu zara aha nna ha, nke bụ na Slavia Prague gbaara aka lawa na be ha.

Chelsea bụ ndị a na-ele anya dịka "onye ogologo", ebe Slavia Prague bụ "onye mkpụkpụ" na ya bụ mgba.

Mana egwu dagharịrị makana ha abụọ tatara ya kọnkịrị ka ha na-anwa ịchọta ọnụ goolu.

Nke a bụ mbụ Chelsea na Slavia Prague na-akwata mpi.

Chelsea emeriela ugboro itoolu n' asọmpi Europa League a, ebe Slavia Prague merigoro naanị otu ugboro.

Akụkọ ga-amasị gị