House of Assembly: Ụlọikpe enweghi ikike ịchụpụ m n'ọkwa Sịnetọ - Ogbuorji

Akụkọ ndị dị mkpa taa:

Ụlọikpe enweghi ikike ịchụpụ m - Ogbuorji

Image copyright National Assembly

Sunny Ogbuorji onye na-anọchite anya Ebonyi South n'ụlọomeiwu asaala okwu ọchụchụ ụlọikpe chụrụ ya dịka onye Sịnetọ.

O kwuru na ụlọikpe enweghi ike ịchụpụ ya n'ọkwa Sịneti kama na ọ bụ onyeisi ndị ụlọomeiwu nwere ikikere ime nke a.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ gbaala akwụkwọ ikpe mkpegharị n'ụlọikpe 'Appeal' ka ha kwuo ma ikpe a ọ bụ ihe ziri ezi.

Ụlọikpe ukwu dị n'Abakaliki nke ọkaikpe Akintola Aluko nọ n'isi ya kwuru na Ogbuorji dara iwu Naịjirịa site n'ịwụpụ na pati ọ nọ nwete ọkwa bụ PDP ma banye APC.

Ụlọikpe a gara n'ihu sị ya kwụọ ụgwọ ihe niile oritere n'uru dịka ọ nọ n'ọkwa sịnetọ nke gụnyere ụgwọ ọnwa niile o riri.

Ndị kpọpụrụ ya n'ụlọikpe bụ Evo Ogbonna Anegu, Oti Ama Uche, Uche Richard, Una Sunday Okoro na Simon Ajali Ogbadu n'aha ha nakwa nke PDP Ebonyi Steeti.

Cheta na Sunny Ogbuorji ji aha pati APC zọọ ọkwa gọvanọ Ebonyi Steeti na ntuliaka afọ 2019.

Agwọ achụọla George Weah ọsọ n'obi gọọmentị Liberia

Image copyright Getty Images

N'ihe dịka akụkọ ifo, onyeisiala mba Liberia bụ George Weah agbala ọsọ ụkwụ ete aja n'ụlọọrụ ya dịka a hụchara agwọ ojii abụọ n'obi gọọmentị mba ahụ.

Odeakwụkwọ mgbasa ozi ya bụ Smith Toby gwara BBC na a hụrụ agwọ ojii abụọ n'ụlọrụ ngalaba naz-ahụ maka ihe na-eme na mba dị ọzọ bụ ebe ụlọrụ Weah dị.

E nyekwara ozi ka ndị ọrụ niile kwụsị ịbịa ọrụ n'ụlọrụ ahụ rue abalị 21 nke ọnwa Eprelu.

Toby kwuru sị na "nke a bụ iji gba mbọ hụ na eji ọgwụ gbagbuo ihe niile na-akpụ akpụ na ihe na-arịgharị arịgharịa n'ụlọ ahụ."

Toby gbara ama na e gbulighị agwọ abụọ ahụ dịka ha gbakpuru n'ime ọnụ ebe ha siri bata.

Toby, onye gara n'ihu kọwaa n'ụlọ ahụ bụ ụlọ ochie kkwuru na Weah ga-alọghachi ụbọchị Monde ma ọ bụrụ na agbacha ọgwụ

________________________________________________________________________________________________________________________

Ụlọụka adaalagbuo mmadụ 13 ụbọchị 'Good Friday'

Image copyright KZN EMS/ Arrive Alive
Nkenke aha onyonyo Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na Saụt-Afríka bụ Mildred Oliphant na-akwadobụ ịga emume 'Good Friday' n'ụlọụka ahụ

Otu ụlọụka adaala na mba Saụt-Afrịka dịka emume Easter na-ebido ma taa isis opekata mpe mmadụ dị 13. ụbọchị Fraide.

Ndị ọrụ gbagbata kwuru na e buhara mmadụ i29 n'ụlọgwụ dịka ụlọụka ahụ dara na mpaghara KwaZulu-Natal.

Akụkọ kwuru na aja ụlọụka 'Penticostal Holiness Church' dara dịka ha na-ebido emume 'Easter'.

Ndị uweojii kwuru na ọ bụ oke mmiri ozuzo zoro na mpaghara ahụ butere ya.

________________________________________________________________________________________________________________________

Nwoke ebepụla onwe ya mkpịsịaka

Otu nwoke India ebepụla mkpịsịaka ya n'iwe ka ọ chọpụtara na ya tụnyere pati abụghị uche ya na ntuliaka na-agan'ihu na mba ahụ ugbua.

Pawan Kumar,onye tụrụ vootu ya ụbọchị Tọzde tụnyere pati nọ n'ọchịchị bụ Bharatiya Janata Party(BJP) kama ị tụnyere patị Bahujan Samaj Party (BSP),nke ndị agbụrụ ya, ndị Dalit ndị na-ekwu na a na-akpagbu ha na Indịa na-akwado.

N'ihe nkiri na-efeghatrị n'ịntanet, Kumar kwuru sịrị, "Achọrọ m ibinye aka ebe e sere enyi mana binye aka na ebe e sere flawa na amaghị ama."

Akara njirimara pati BJP bụ enyi, ebe nke BSP bụ flawa.

________________________________________________________________________________________________________________________

Praim Minista mba Mali achịsala ọwa

Soumeylou Boubeye Maiga Image copyright Getty Images

Praim Minista mba Mali bụ Soumeylou Boubeye Maiga na ndị ọchịchị ya etinyela akwụkwọ arụkwaghị ụbọchị Tọzde dịka ngagharịiwe sochiri tigbuo zogbuo nke tara isi mmadụ otu nari na iri na mpaghara Mopti dị n'agbata ha na Burkina Faso.

Puku kwuru puku ndị mmadụ mere ngagharịiwe n'abalị ise nke ọnwa Eprelu dịka e gbuchara ihe mmadụ were na-ekwu na gọọmenti emeghị ihe kwesiri ka o me iji kwụsị tigbuo zogbuo ebe ahụ.

________________________________________________________________________________________________________________________

Image copyright @BashirAhmaad

Easter Celebration: Buhari ekelela ndị otu ụka Kraistị

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ezigarala ndị otu ụka Kraist Naijiria ozi ekele dịka emume Easter na- akpụrụ ọkụ n'ọnụ ma kpoo oku ka ha ṅomie agwa Christ site na-egosi ihunaya, umeala na ndidi.

Buhari onye kwere nkwa na ọchichị ya ga-akwado ndị ọrụ nchekwa n'ụzọ pụrụ iche iji hụ na nsogbu ntọ,ndị ohi nakwa ndị na-eyi ndụ egwu bịara n'isi njedebe kpọrọ ndị otu Kraist okpu ka ha kpesie ekpere ike ka udo lọghachi n'ala Naijiria.

________________________________________________________________________________________________________________________

Ndị uweojii Enugwu anaghị achị

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadu na-akato oke ogbugbu mmadu ndị uweojii na-eme

Ndị uweojii na Enugwu Steeti ewepụtarala ndị omekome anya ha ji anyụ nsị dika ha hiwere atụmatụ pụrụ iche ha kpọro 'Operation Puff-Adder' na bekee maka ịwa agba ndị ntọ na ndị ojiegbeeezu na-akpa ike steeti ahụ agba ọkachasị n'okporoụzọ Affa Egede, Umulokpa nakwa ụzọ Affa Technical School .

________________________________________________________________________________________________________________________

N'egwuregwu,

A kpụla onye nchịkọta otu egwu bọọlụ United Football Club of Nnewi bụ Olisa Onuchukwu, ụlọikpe ukwu nke etiti dị n'Oka Anambara steeti maka iji magomagọ napụ otu ojiegoachụ egọ a kpọrọ Ndubuisi Nwobu ego ruru nde Naira abụọ na ụma bụ ego o kwuru ya ga-eji ezipụ ndị na-eto eto ala bekee maka ịgba bọọlụ.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a