Chelsea VS Slavia Praha: Ọ fọro ntakịrị ka ekwe kụọ n’isi Chelsea

Chelsea Image copyright Getty Images

Ọ bụghị obere ihe mere n'azụ ụlọ Chelsea ka e nyechara ọkpụ goolu asaa n'ime otu egwuregwu a.

Goolu abụọ Pedro nyere n'ime nkeji ise na nkeji 27 nke Olivier Giroud nyere na nkeji 17, na nke Simon Deli nke Slavia Prague ji aka ya gbakpuo n'ime neetị ha zuru ime ka Chelsea chee na ha alaferela.

Tomas Soucek nke Slavia gbalịkawara ihicha ndị otu ya ihu ka o nyere goolu na nkeji 25.

Image copyright Getty Images
Image copyright Getty Images

Mana dịka a banyere n'ime ọkara nke abụọ, Petr Sevcik nke Slavia eburu nsogbu ya bịa sị ha "teta n'ụra".

Sevcik nyere goolu abụọ n'ime nkeji 51 na 54 iji nye ndị ya olileanya.

Mana "Chi" ndị Chelsea gbadatara bịa zọpụta ha n'ihe gaara abụ ihere.

Image copyright Getty Images

Chelsea ga-ezute Eintracht Frankfurt n'agba ọkara-ikpeazụ n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Mee.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a