Ohaneze asaala Garba Shehu: O nweghị ‘sacramentị’ jịkọrọ anyị na Miyetti Allah

Ndị ichie ji okwu Image copyright Chief Sunday Jude Iyoke
Nkenke aha onyonyo Ndị ichie ji okwu tupu a waa ji

Otu Ohaneze agbakala maka okwu Garba Shehu kwuru ebe o jiri Ohaneze Ndigbo na Afenifere tụnyere otu Miyetti Allah.

Shehu kwuru na mkparịtaụka ya na Channels TV nwere n'ụbọchị Tuzde na Miyetti Allah na Ohaneze nakwa Afenifere bụ otu jikọrọ ndị Yoroba bụ otu ihe dịka ha bụ otu odinala.

Mana Ohaneze kwuru na okwu Shehu kwuru bụ 'arụ' na o nweghị ihe jịkọọ udele na 'barber'.

Ha sịrị na o nweghị mgbe Ohaneze ji akwado ịkwafu ọbara dịka Miyetii Allah si akwado ndị ọchịehi na-egbusi ndị mmadụ na mpaghara dị iche iche na Naijiria.

Na mkparịtaụka BBC Igbo na Chuks Ilegbu bụ odeakwụkwọ Ohaneze nwere n'ekwentị, o kwuru na "njirimara Miyetti Allah kemgbe Buhari ji bata n'ọchịchị bụ ịkwado ndị na-akwafu ọbara. Otu Ohaneze ọ na-akwafu ọbara?"

"Ohaneze, na Afenifere bụ ndị sị ka obodo dị mma, egbe bere ,ugbo bere, ha abụghị ndị na-aakwado ịkwafu ọbara."

"Mana Miyetti Allaha na-akwado ndị ọchịehi na-akwafu ọbara, na-azọtara ndị ọchịehi na-egbusị ndị mmadụ."

Image copyright Chief Sunday Jude Iyoke
Nkenke aha onyonyo Akwa isiagụ pụtara n'ọgbọ

"Ọ (garba Shehu) kwuru arụ. Ihe o kwuru bụ ihe e ji atụ ya nga na ọ bụụ ọbodo ihe na-aga etu o kwesịị n'ihi na ọ na-egosi nkwado nye ndị na-akwafu ọbara."

Cheta na Shehu kwuru na o kwesịghị ka e jiri ihe ndị omekeome ụfọdụ bụ ndị Fulani mere were na-akpọ ndị Miyetti Allah ajọ aha.

"Miyetti Allah dịka Ohaneze maọbụ Afenifere bụ otu odinala."

"O nwere ndị omekome n'agbụrụ ndị Yoroba, ị gagaghị asị n'ihi na e nwere ndị omekeome ndị Yoroba na Afenifere bụ otu ndị omekome."

" Gọọmenti etiti na ndị ndu otu jịkọọ ndị Fulani bụ Miyetti Allah nwere mkparịtaụka n'ezie."

Nke a bụ n'ọsịsa akụkọ na-efegharị nke kwuru na gọọmenti etiti nyere Miyetti Allah nde 100 iji kwụsị nsogbu ntọọ na ike ndị ọchị ehi na-akpa.

Mana Shehu gọrọ na o nweghị ego e nyere ndị Miyetti Allah.

Emmanuel Onwubiko, onye isi otu ndị na-ede banyere ikike dịrị onye tụrụ arịrị na ndị ọchịchị ji nsogbu nchekwa eme okwu ndọrọndọrọ ọchịchị.

O kwuru na "o kwesịghị ka gọọmenti etiti na Miyetti Allah, otu a ma na-akwado ndị ji ngwaọgwụ ha ji achị ehi egbu ndị mmadụ inwe ọgbakọ maka mkparịtaụka maka nchekwa."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: