Xenophobic Attacks: Ndị Nigeria 5 merụrụ ahụ na nsogbu dara n'etiti ụmụ Naijiria na ndị Togo

Ụmụafọ Igbo e merụrụ nnukwu ahụ na Togo Image copyright Kriss Ebere
Nkenke aha onyonyo Ndigbo etiri gwo gwo maka okwu agbasaghị ha na mba Togo bụ ndị agbataobi onye nwere okwu

Nsogbu bidoro n'etiti enyi na enyi aghọọla ọgbaghara mba na ibe ya gara ata isi mmadụ ma ọ buru na ndị uweojii egboghị ọgụ ahụ n'oge.

Nsogbu dapụtara n'etiti Ndigbo bi na mba Togo na ndị ha bi be ha edugala mmadu ise n'ụlọọgwụ ebe ha na-anata nleta maka oke mmerụahụ ha nwetara.

Ebe ọtụtụ ka na-agụkọ ihe furu ha dịka ndị a na-arụ aka na ha bụ ndị Togo wakporo, zuo ma mebicha ngwaahịa ụfọdụ ụmụ Igbo na-azụ ahịa n'Ahịa Assiyeye dị na Lome, isiobodo Togo.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption"Obi adịghị m mma ma e jiri egbe m rụpụtara gbuo mmadụ"- onye ọkpụụzụ

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ esemokwu dị n'etiti okorobia Igbo na enyi ya nwaanyị bụ ihe bidoro nsogbu ahụ.

Mmadu abụo ahụ bụ ndị bikọrọ ọnụ nwere nghọtahie lụọ ọgụ merụọ onwe ha ahụ, nke nwaanyị gara kpọọ ndị agboro mana nwokorobia ahụ gbara ọsọ oge ọ hụrụ ha.

Akụkọ kwuru na dịka ọ gbara ọsọ ha bido ịwakpo ndị Igbo ndị ọsọ bi na mbara ahụ, kụtọsịa ha dịka ha boro ha ohi.

BBC Igbo nwetara ihe onyonyo gosiri ebe a kụrụ ndị ahụ ihe tinka na-akụ panụ, ọbara juu ha ahụ mana anyị agaghị enwe itinye ya n'ime akụkọ n'ihi na ọ bụ ihe na-ata arụ n'anya nke ukwuu.

Image copyright Kriss Ebere

Dika otu onye Igbo achọghị ka a kpọ aha ya siri kọwara BBC Igbo, "Ọ bụ nwoke ya na enyi ya nwaanyị bi nwere nghọtahie."

"Ha kụọ onwe ha ihe. Nke nwoke merụọ nke nwaanyị ahụ, nke nwaanyị merụkwa nke nwoke ahụ."

"Nke nwaanyị gbapụọ kpọrọ ụmụ agboro bịa."

Image copyright Kriss Ebere

"Oge nwoke hụrụ ndị agboro, ọ wụọ aja gbaalaga. Ndị agboro gaa tiwa ọnụụzọ ụlọ Ndigbo bi n'otu mbara ahụ kụwa ha ihe."

Ọ gara n'ihu boo n'ebubo na ndị mba ahụ nyere nkwado dịka a na-akụ ndị ahụ ihe n'ihi "ha ejighị ntị anụ ihe banyere Ndigbo."

Image copyright Kriss Ebere
Nkenke aha onyonyo Ahịa Assiyeye dị na Lome,Togo

Otu onye ahịa ya so na nke ndị e zuru a kpọrọ Godwin Kalu gwara BBC Igbo na ọ bụ ka ndị uweojii bịara zọọ ụmụ Igbo ahụ ka ndị igwe ndị ala chọrọ isunye ha ọkụ.

Kalu kwuru na ka ndị uweojii kọrọ ndị e merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ, ddị ala ahụ jịkọọ gawa ahịa Assiyeye ndị nso ebe ahụ ebe ha wakporo ọdọahịa Ndigbo ma zuo ma mebie ọtụtụ ngwaahịa ha.

"Ọdọahịa nọ n'ọnụ okporoụzọ esi abanye n'ime ahịa".

"Ha wakporo ọhịa na-elu okwute. M na ndị nọ n'ọdọahịa gbagbuo n'ime kpochie ụzọ."

"Ha buru akpa akpụkpọụkwụ m na-ere ere abụọ.

"Otu akpa nwere akpụkpọ ukwu iri ise."

Image copyright Kriss Ebere

Ndigbo nọ na Togo tụrụ arịrị na mbeku ha bekuru ụlọnnochiteanya Naijiria na mba ahụ amịtaghị mkpụrụ dịka a gwara ha n'onyeisi bụ Segun Ibidapo-Obe gara njem na Naijiria.

Otu onye uweojii mba Togo achọghị ka a kpọọ aha ya (n'ihi na o nweghị ikike ikwu n'aha ndị uweojii) gwara BBC Igbo n'ekwenti na ihe ahụ mere n'ezie.

"Anọ m a kpọ m gwa m na o nwere ndị a na-eti ihe, anyị ga-ebe ahụ ọ bụrụ ndị Naijiria."

Image copyright Kriss Ebere

Onye uweojii onye kwuru na ndị na-akụ ihe boro ha ebubo izu ohi, kọwara na ha (ndị uweojii zọpụtara ndị ahụ ma dugaa ha ụlọogwụ.)

O kwụghị ma ndị uweojii a na-enyocha ya bụ okwu na ọ gwara Ndigbo bi n'ala ahụ atụla ụjọ ihe egwu ime ha ọzọ.

Mbọ BBC gbara ịnụta uche ụlọnnochiteanya Nigeria na mba Togo amịtaghị mkpụrụ dịka ha azaghị ekwenti ha na ozi e zigara ha site n'igbeozi ịntanet.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a