Northern Coalition to Fulani herdsmen: 'Lọtanụ, hapụnụ Ndịda Naijiria'

Nnamdi Kanu, Okechukwu na Nnia Nwodo Image copyright Getty/Obioha/BBC

Otu Ohanaeze, Ipob nakwa otu Njikọ Igbo ekwuola na ha anaghị achụla ndị Fulani na-achị ehi kama ha chọọ ịla, ha lawa.

Ha kwuru na ihe ndị Igbo achọghị bụ ndị na-eme mpụ; ndị ntọ, ndị ohi, ndị na-awakpo ụmụnwaanyị n'ike nakwa ndị na-emebi ugbo.

Okwu a bụ n'ọsịsa oku nke otu jịkọrọ ndị okenye na ndị ntorobia ndị Ugwu kpọrọ ụbọchị Tuzde ka ndị Fulani ọchịehi niile nọ n'Ọdịda Naijiria lọghachi Ugwu Awụsa.

Otu Ohaneze kwuru na oku ahụ "jọgburu onwe ya", sị na o nweghị onye Ndigbo sịrị ya lawa karịa ndị na-eme mpụ dịka ịtọ nakwa igbu mmadụ maọbụ izu ohi.

Ha rụtụrụ aka na ọ bụ mmadụ ole na ole enweghị ndị họpụtara ha ji aka ha na-etinye ọgbaghara.

Ọnụ na-ekwuru Ohanaeze bụ Chuks Ilegbu sị,"O nweghị onye Ndigbo sị ya lawa. O nweghị onye na-achụ onye ọbụla. Ọ bụ ndị Ugwu nọ na-ekwuru onwe ha."

"O nweghị onye Ndigbo sị ya lawa, mana onye ọbụla na-eme mpụ; onye ntọ, onye na-egbu mmadụ, aka ga-akpara ya."

Ihe Ipob kwuru

Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu kwuru na "Ezinaụlọ Ipob n'ụwa niile nabatara mkpebi ndị ndu Fulani ịkpọghachị ndị nke ha."

"Obi anyị na mkpebi anyị nọ na Ndịda agbanweela na-enweghị nlaghachị azụ; Ịtọgahpụ ndị a na-akpagbu."

Na mgbakwunye, ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Rev Peace Chukwudi, sị na "Anyị asịghị ha lawa mana anyị nabatara ya nke ọma. Ọ bụ ezigbote ihe, bụrụ ihe kwesịrị na ha kwaara ihe ha pụọ."

O kwukwara na ọ ga-amasị otu Ipob na ndị ọchịehi ga-eme ihe ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ ha ka ha na-ebu ehi ha n'ụgbọala kama ị na-achị ya na-agagharị."

Ihe Njik Igbo tụnyere n'okwu ahụ.

Image copyright Okechukwu Obioha
Nkenke aha onyonyo Okechukwu Obioha bụ onye isi otu Njikọ Igbo

N'okwu ya, onyeisi Njikọ Igbo bụ Rev Okechukwu Obiora kwuru na "ọ bụghị isi n'ọnụma na iwe, ngwa lọtawanụ, ha chọkwaa ịla, ha lawa."

Obioha kwuru na "Ọ ka mma ndị ndu ahụ isi n'otu Miyetti Allah gwa ha ka ha ghara ị na-emenina ndị ha nọ be ha akpa ehi."

Image copyright Getty Images

Otu Northern Elders Forum (NEF) na otu 'Coalition of the Northern Groups' boro ebubo na ndị ndu Ndịda Naịjiria gụnyere ndị gọvanọ ha majara ndị Fulani ọchịehi sị na-ha ga-ebuso ha agha.

Ha kwuru nke a n'ọgbakọ ha kpọrọ ndị ntaakụkọ n'Abuja ụbọchị Tuzde, kwuru na ndị ndu ndị Ọdịda-Anyanwụ na-amaja ha, na ha ejighị ndụ ha aka.

Ango Abdullahi, onye kwadoro ihe ndị otu a kwuru sị "Obi na-akụja anyị na ọ bụụ na ndu ha koro n'elu, ọ ga aka mma na ha lọtara ebe ndụ ha ga-enwe nchekwa. Ndụ ha ka mkpa karịa ebe ha nọ."

N'okwu ya, ọnụ na-ekwuru otu 'Coalition of Northern Groups' bụ Abdul-Aziz Sulaiman sịrị na gọọmenti ugbua kemgbe afọ anọ achọghị iwepụta amụma ga-akwụsị nsogbu ndị ọchịehi maọbụ mee ihe ọbụla banyere ndị Fulani a na-awakpo na steeti dị icheiche."

Cheta na mgbaha sochiri atụmatụ Ruga nke gọọmenti etiti tụpụtara iji nye ndị ọchịehi ala na steeti dị iche iche dị na Naijiria.

Ọzọ dịka ibe ya bụkwa ọnwụ Funke Olakurin, nwa otu n'ime ndị ndu otu Afenifere bụ Reuben Fashoranti nke ụfọdụ na-ebo ebubo na ọ bụ ndị Fulani ọchịehi gburu ya.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionProf Austin Nwagbara: A dụrụ ihe onyonyo ahụ tinyere m na nsogbu na mahadum Ghana adụ

Ọtụtụ steeti dị na Ọwụwa-Anyanwụ na Ọdịda ya jụrụ iwepụta ala, sị na ha achọghị ya.

Akụkọ ga-amasị:

Isiokwu Ndị Emetụtara