Miyetti Allah South-East: O nweghi ebe anyị na-aga n'ihi na Ndigbo anaghị enye anyị nsogbu

Ndị Fulani ọchịehi Image copyright AFP

Otu Miyetti Allah bụ otu jịkọrọ ndị ọchịehi ngalaba nke Ọwụwa-Anyanwụ Naijria ekwuola na ha adịghị njikere ịza oku ndị siri ha lọghachi Ugwu.

Ha kwuru na o nweghị onye na-enye ha nsogbu n'Ọwụwa-anyanwụ ga-eme ha hapụ ebe ahụ lọghachiwa Ugwu-Awụsa.

Na mkparịtaụka onyeisi otu Miyetti Allah n'Ọwụwa-Anyanwụ bụ Alhaji Sidikki Gidado na BBC nwere n'ekwentị, o kwuru na ha adịghị nkwadobe ịga ebe ọbụla.

"Anyị agaghị aza oku ahụ n'ihi na anyị na ndị Ọwụwa-Anyanwụ enweghị nsogbu. Anyị bi n'udo."

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo E gbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgụ dị n'etti ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo

"Ndị ọchịchị steeti dị icheiche hibere otu na-eleba anya na nsogbu ọbụla dapụtara n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo."

Ọ gara n'ihu katọọ oku ahụ ndị okenye Ugwu akpọrọ 'Northern Elders Forum' nakwa ndị 'Coalition of Northern Groups kpọrọ, sị na ha na-awụnyere ha aja na garị.

"Ụdị oku ahụ ga-ebutere anyị nsogbu."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwanne Nnamdi Kanu ekwuola ihe mere o ji bụrụ ọpụrụiche

Siddiki dụrụ ọdụ ka ndị Ugwu na nke ndị ndu Ọwụwa-anyanwụ gbakọta ọnụ nwee mkparịtaụka ma e nwe nsogbu kama ị na-akpọ ụdị oku a.

Gee ihe o kwuru n'olu Bekee:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMiyetti Allah: Anyị agaghị aza oku 'Northern Elders kpọrọ- Ndị Ochịehi

Cheta na abalị ole na ole gara aga, otu jikọrọ ndị okenye na ndị ntorobia ndị Ugwu a kpọrọ ụbọchị Tuzde ka ndị Fulani ọchịehi niile nọ n'Ọdịda Naijiria lọghachi Ugwu Awụsa.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkwuke na ndị na achị ehi na-ebi n’udo

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a