Nigerian Ministers: Ka o si aga na nnyocha ndị ga-abụ mịnịsta n'Ụlọomeiwu Ukwu

Emeka Nwajiuba, Godswill Akpabio na Uche Ogah Image copyright Nwajiuba,Akpabio and Ogah /Facebook

Ụlọomeiwu Ukwu ebidola nnyocha ndị a họpụtara ga-abụ mịnịsta ụbọchị Wenezde.

Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari zigarala ndị Ụlọomeiwu Ukwu aha ndị ọ chọrọ dịka Mịnịsta ụbọchị Tuzde.

Nwa afọ Abịa steeti ahụ bụ Uche Ogah bụ onye mbụ banyere n'ọgbọ dịka ndị omeiwu chara ya ọkụ n'ụzọ pụrụ iche.

Mana Ogah sakwara ha dịka onye mara nke a na-akọ dịka o siri gbasaa ụlọakụ, mmepụta mmanụ na ihe ndị ọzọ.

Lee ụfọdụ ihe a jụrụ ya na nke ọ sara ha:

Ajụjụ a jụrụ Uche Ogah na ọsịsa ya:

Image copyright Uche Ogah

TSA: Ịnata ego ụlọakụ na- atara gọọmenti. Ọ bụ na o nweghị ka a ga-esi mee ka ndị ụlọakụ na-enweta ego dịka TSA pụrụ ha ara n'ọnụ ?

"Itinye ego na TSA, ego ndị a tọgbọgbọrọ nkịtị, o o nweghị ihe ego ahụ na-eme na ịkwalite akụnaụba."

"Onye ọbụla mara ihe mere oge e bidoro TSA, ọ chọbụrụ ịkwada ọtụtụ ụlọakụ. O bụ CBN gbatara ha ọsọ enyemaka.

Ọ bụrụ na e nye ọkwa Mịnịsta na-ahụ maka 'Commerce and Industry,' kedụ ihe ị ga-eme ka ịkọlite mmepụta ihe ka ndị na-eto eto nwee ọrụ?

"Ọ bụghị ọrụ gọọmentị iwepụta ọrụ. Ọrụ gọọmentị bụ ime ka ọnọdụ akaụnba dị mma nke na ndị mmadụ , ụlọọrụ ga na-ewepụta ọrụ."

Ọ ka mma imezi ụlọmmanụ(refineries) anyị ka ọ bụ ka ahapụ dịka e mefuruola nde kwuru nde irụzị ya ma arụtaghị ha?

"Agaghị m akwụ ebe gwa ụnụ ka ihe mmebi dị n'ụlọmmanụ anyị ha."

"Ihe kacha mma bụ ka anyị nwee ụlọ na-esi mmanụ. O kwesịrị ka anyị nwe mkpebi ime ka ụlọmmanụ anyị rụwakwa ọrụ ọsọ ọ bụghị otu a."

"Ọ bụrụ na ụlọ na-esi mmanụ arụghị ọrụ, n'afọ iri na-abị, anyị agaghị enwe ego anyị ga-etinye n' ọrụ iwu ewuwu na-akwalite akụnaụba Naijiria."

Akume bara klaasị ọhụrụ na eleghị ule

Ndị omeiwu agbaghị Senetọ Akụme ajụjụ ka a kpọpụtara ya n'Ụlọomeiwu taa.

Ha kwuru na dịka ka si emebu na ha anaghị agba onye bụbu Senetọ ajụjụọnụ.

Image copyright George Akume

Akpabio wụfere na enweghị mgbochi ọbụla

Image copyright Godswill Obot Akpabio Facebook

Senetọ Enyinnaya Abaribe kwuru na ya kara etinye otele Akpabio n'ọkụ ma ọ bụghị n'ihi 'omenala' ndị ụlọomeiwu ịhapụ onye bụbu Senetọ ka ọ banye Klaasị ọhụụ na eleghị ule ọbụla.

Abaribe rịrịọ ya ka ọ nọchite ha anya nke ọma dịka ọ na-abanye n'ọkwa ọzọ.

Onyeisi Ụlọomewu bụ Ahmed Lawan dụrụ Akpabio ọdụ ka ọ gbaa mbọ hụ na mmekọrịta ụlọomeiwu na ndị mịnịsta na aga siriri-werere.

Lawan jụrụ ndị otu ya ha ekwenyere ka Akpabịọ nafere na ajụghị ya ajụjụ ọbụla, ha niile kwee, 'Eyeeeh'!

Emeka Nwajiụba naferele ka ugo

Image copyright Emeka Nwajiuba /Facebook

Ndị omeiwu gwara ya gawa n'ihu na enyeghị ya mmaja ọbụla.

Nke a bụ n'ihi na nwa afọ Imo steeti bụ okaiwu tinyere obi ọnụ n'ime ọtụtụ n'ime ha ọ kọwara onwe ya na ihe o merela ka a kpọpụtara ya dịka .

Ihe ọzọ nyekwara ya aka bụ na ọ rụọla dịka onye nnọchiteanya mpaghara Okigwe South n'ụlọomeiwu Nta.

Cheta na Nwajiuba nọbụ na APC si ya wufere Accord Party ebe o siri nweta mmeri ịbanye Ụlọomeiwu Nta.

Ndị ụlọomeiwu gara zuru obere ike ma lọghachi.

Mgbagha so inyocha Rotimi Amaechi

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rotimi Amaechi bụ onye chigburu Rivers Steeti n'etiti afọ 2007 na 2015

Oge ndị Ụlọomeiwu gachara ṅụrụ mmiri ma lọghachi.

Mgbe ha lọghachiri, Ahmed Lawan kpọrọ oku ka ndị isi ụlọomeiwu kwuo okwu tupu ha ahapụ Amaechi ka ọ gawa 'n'ihi na ọ bụbu 'Speaker'.

Mana 'Minority leader' bụ Enyinnaya Abaribe kwuru na ya na ndị Rivas nọ n'ụlọomeiwu akpaghị maka ị hapụ Amaechi.

Abaribe kwuru na ndị Rịvas siri ya ha jụọ Amaechi na ha tụrụ anya na dịka mịnịsta nke Naijiria nke gụnyere Rịvas steeti, ọrụwa ok[poro ụgbọoloko ya chetakwa ndị nọ akụkọ ọwụwa anyanwụ site n'Agbọr were gaa Iyiocha.

Ha mechara hapụ ya ka ọ lawa na azaghị ajụjụ ọbụla.

Ogbonnaya Onu akụkọ teknụzụ kọjụọ ha anya

Image copyright Ogbonnaya Onu/Facebook
Nkenke aha onyonyo Ogbonnaya Onu

Ogbonnaya Onu were ọnọdụ n'ihu ha ka Amechi pụchara.

Ndị omeiwu jụrụ ya ihe o mere dịka Mịnịsta na-ahụ maka nka naụzụ n'ọchịchị Buhari?

O kwuru na ya gbalịlị iwelite mkpa ọ dị itinye uchu na Sayensi na teknụzụ.

N'ikwu maka mkpa Sayensi dị na mmepe obodo, ọ rụtụrụ aka na "o nweghị obodo na-emepe ma ọ bụrụ na ha agbasoghị sayensị na teknụzụ."

N'ịkọwa onwe ya, ọ kọwapụtara ihe ndị o merela dịka mịnịsta na-ahụ maka nka na ụzụ na Naijiria na-etu onyeisiala Muhammadu Buhari si nye ya nkwado ime ihe ndị ahụ.

Ndị ụlọomeiwu kwekọrịtara ka ọ gawa na-ajụghị ya ajụjụ ọbụla.

Image copyright Olurunnimbe Mamora /Facebook

Olurunnimbe Mamora

Nwa afọ Legọs a nọchiteburu Lagos East n'Ụlọomeiwu Ukwu kọwara onwe ya nakwa ọkwa ndị o jiburula.

Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu bụ Ahmed chetara ndị ogbo ya iwu ha ịhapụ onye nọrọla n'Ụlọomeiwu mbụ ma kpọlite onyeisi ha nakwa onyeisi ndị pekarịrị9Minority leader) ka ha chịkọta okwu.

Abaraibe kerele Mamora "enyere gị ọkwa ekweghị ebe i siri pụta, ị kwanyere anyị ukwu ịjụ ịnata ya."

Ube Olalekan Adegbite eruola

Nwa afọ Ibadan eruola dịka ọm kọwarala ndị omeiwu etu o siri bido n'ịrụ na ụlọọrụ nọrọ onwe ya(private sector) bido mgbe ọ nọ na mahadum, were banye ịrụ ọha ọrụ (public service).

Adamu Adamu

Image copyright education.gov.ng
Nkenke aha onyonyo Adamu Adamu bụ mịnịsta na-ahụ maka ọgụmakwụkwọ n'agba nke mbu ọchịchị Muhammadu Buhari

A jụrụ ya ihe o nwere ikwu maka ọnọdụ agụmakwụkwọ na Naijiria dịka ụmụaka gbaghapụụ agụmakwụkwọ Praimarịrị gara elu karịa

Sharon Ikeazor zọfere ke enyi nnụnụ

Image copyright Sharon Ikeazor/Facebook

Onye ọzọ a kpọpụtara ịzara ọnụ ya bụ Ada Anambra rụrụ ọrụ ya ikpeazụ dịka onyeisi ngalaba ụgwọ ezumike nka a kpọọ Pension Transitional Arrangement Directorate (PTAD)

Ọ kọwara ihe ndị niile o mepụtara dịka ọrụ ya siri dị na otu ọrụ ya siri gbanwe ndụ ndị lara ezumike nka.

Ka o kwuchara , ndị omeiwu kwekọrịtara ma hapụ ya ka ọlawa "ihi na ọ bụ nwaanyị."

Ọ bụ ebe ka ndị omeiwu wụsara ọwa ma kpebi ibido ebe ha kwụsịrị ụbọchị Tọzde.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNne m chọbụrụ ịza 'mma engineer' - Zoro