Fuel scarcity: Ọdụ mmanụ ụgbọala niile dị n'Enugwu gbachiri agbachi

Ọdụ mmanụ agbịdị

Ndị mmadụ bi n'Enugwu na-ata ikikirieze tata bụ Wenezde dịka otu jikọrọ ndị na-ere ma na-ekesa mmanụ ụgbọala gbachiri ọdụ ahịa ị iche iche n'ihi na e nwere nsogbu n'etiti ha.

Ndị otu PEDAN na IPMAN ka a na-arụ aka na ọ bụ ha gwara ndị oti ha ka ha gbachisia ụlọ mmanụ ha.

Ya bụ mgbachi bịara ndị Enugwu na mberede nke bụ na ndị njem na ndị nwere ụgbọala nọ na nsogbu ugbua.

BBC gagharịrị Enugwu niile wee hụ na o nweghị nke mepereụbọchị Wenezde.

Naani ọdụmmanụ nke gọọmenti nwe bụ NNPC bụ ihe na-ere mmanụ ụgbọala.

Nari kwụrụ narị ụgbọala kwụzị na ahịrị na ahịrị na NNPC mega dị n'Enugwu eche mmanụ.

Akụkọ ga-amasị gị: