Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Nnewi Women: Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?

Nnewi, Anambara steeti bụ obodo na-ewu ewu maka ndị nwere agba si ya pụta dịka Innocent Okeke (Innoson), Cosmas Maduka(Coscharis), Ibeto, Ogbuawa na ndị ọgaranya ọzọ.

Mana, ihe ọzọ e ji mara Anaedo bụ ‘Nwaanyị Nnewi’.

Nke a bụ ihe e jiri mara ọgbatutum ụmụnwaanyị ndị Nnewi na-agbakarị.

Ọgbatumtum ụmụnwaanyị na-ewu ewu na Nnewi nke na ọ hịara ahụ ịhụ ezinaụlọ Nnewi ọ dịghị.

A mara ụmụnwaanyị Nnewi maka ịgba mbọ mana ọtụtụ amaghị na ọ bụ ọgbatumtum bụ ihe na-akụrụ ha nkwa ha na-agba.

Ụmụnwaanyị Nnewi ji ngala akwọ ya dịka ha ji ya aga ahịa, ugbo, akwamozu,ụka na mkpa dị ọzọ dịrị ha.

N’ihe onyonyo, ụmụnwaanyị ndị Nnewi kọwara BBC Igbo ‘sacrament jikọrọ ha na ọgbatumtum:

Isiokwu Ndị Emetụtara