Presidential Election Tribunal: 'Ihe anyị nyere Buhari bụ mpụtara ule ya ọ bụghị asambodo Waec'

Akụkọ ndị dị mkpa

Buhari na asambodo ya Image copyright Bayo Omoboriowo
Nkenke aha onyonyo Keduzị asambodo nke a Buhari ji?

Onyeọrụ 'West African Examination Council' agwaala ụlọikpe na onyeisiala Muhammadu Buhari mere ule 'Cambridge University Assessment International Education' nke Cambridge na Waec gbakọrọ ma na ihe o nyere abụghị asambodo Waec, ọ bụ mpụtara ule ya.

Osidehinde Adewunmi onye bụ osote onyeisi Waec rụọrọla ọrụ n'ụlọọrụ ahụ afọ 30 kwuru na Buhari so na mmadụ iri na asatọ lere ule ahụ n'afọ 1961.

Ọ gara n'ihu kwuo na Buhari lerere sọbjet asatọ ma nweta ise gụnyere - Oral English- C5; History- A3; Geography- C6; Hausa- C5 nakwa Health Science- C6.

Mana mgbe a jụrụ Adewunmi ma mpempe akwụkwọ ahụ ebere ihe o nwetara abụ asambodo waec. Ọ sịrị mba na "ọ sịghị na waec.".

Okwu si n'obi gọọmentị etiti na-ekwu na Onyeisiala Muhammadu Buhari ebibiela otu oyiegwu na-akpa mkpamkpa na Naịjirịa kemgbe afọ iri bụ Boko Haram.

Islamic Movement in Nigeria: Anyi ga-akwụsi ngaghariiwe

Image copyright Getty Images

Otu ndị Shia nke onye ndu ha bụ El-Zakzaky ekwuola na ha ga-agba jim na ngaghariiwe ha na-eme nke ha ji ekwu ka a tọhapụ onyeisi ha.

N'akwụkwọ ozi ha wepụtara ụbọchị Wenezde nke onyeisi mgbasaozi ha bụ Ibrahim Musa binyere aka, ha kwuru na mkpebi a bụ n'iji nye ohere ka ekpezie okwu ahụ dịka ndị nwere agba siri tụnye ha n'alo.

Cheta na ngagharịiwe a tara isi ndị uweojii na mmadụ nkịtị dịka ndị uweojii na ndị Shia kwatara n'Abuja na nsonso.

Buhari ebibiela ndi otu Boko Haram- Ụlọọrụ onyeisiala

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Buhari bidoro njem nleta n'obodo ndị nwere ọgbaghara na Naịjirịa nke gunyere Taraba, Plateau, Benue tupu ọ gawa Yobe.

N'akụkọ ozi ha ziputara, ha kwuru sị na ihe fọrọ ugbua bụ ngwọkọta ihe fọrọ na Boko Haram, ndị omekome gbara ọsọ, ndị alakụba nọ na Maghreb nakwa ụfọdụ ndị omekome si mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka.

Cheta na Atiku Abubakar na otu PDP gbara Buhari akwụkwọ banyere ntulikaka 2019 ebe ha na-ekwu na Buhari agụzughị akwụkwọ ịchị dịka onyeisiala.

IPOB adọọla aka na nti

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nnamdi Kanu kwuru ka ndị otu Ipob gbajọọ ntuliaka na-abịanụ

Ndị otu IPOB etinyela ọnụ ma kagbuo ihe ha kpọrọ mmegide na mkpagbu a sị na ndị agha mere ndị aka ha dị ọcha n'Aba dị n'Abịa steeti.

Nke a na-abịa dịka akụkọ pụtara na ndị agha kpụrụ ndị bu isi dada isi, tie ha ihe ma nwụchiekwa ha n'ụbọchị satọde gara aga.

Ụmụakwụkwọ Sudan na-ewe iwe

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Ụmụakwụkwọ yi afe akwụkwọ ha na-eme ngagharị iwe

Ị nụrụ ihe na-eme na mba Sudan ebe ụmụakwụkwọ na-eme ngagharịiwe maka ndị otu ha anọ a gbagburu n'ọgbakọ ha gara n'obodo Kordofan?

Ndị agha na-achị obodo ha ejirila maka ya nye iwu sị ka e mechie ụlọakwụkwọ niile dị na mba ahụ bido taa ruo mgbe ha ga-ekwuputa ka e meghee ya.

Manchester United na-atụ mgbere Paul Dybala

Image copyright Getty Images

Oge eruola mgbe ndị na-akwado Manchester United ga-ebido imali elu dịka ha na-ekwu okwu ịzụta Paulo Dybala?

Akụkọ kwuru na ha na ndị Juventus na-ekwu okwu maka ịzụta nwaamadị a si mba Ajentina.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBoko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a