PortHarcourt Murder: Ndị uweojii na-achọ nwokorobia tọgburu enyi ya nwanyị n'ụlọoriri

Ndị uweojii Naijiria Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii

Ndi uweojii na Rivas steeti ekwuola na ha na-achọ nwokorobia a na-eche na ọ tọgburu nwagbọghọ n'ụlọ oriri na nkwari n'ụbọchị Tọọzde.

Dịka akụkọ na-ewu na soshal midia 'Facebook' a hụrụ ozu nwaagbọghọ ahụ n'ime ụlọ ebe ya na otu nwoke so laba, mana a hụzighị nke nwoke ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 2019.

Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Omoni Nnamdi, ọ gwara anyị na ihe ahụ mere eme n'eziokwu.

Nnamdi, onye ji ọkwa DSP kwuru na ọ gaghị akpọ aha ụlọ ndịna ebelebe a nọrọ gbuo.

O kwuru sị: "Onye nwe ụlọ ndịna ahụ bịara gwa anyị ihe merenụ, mgbe anyị rutere, anyị hụrụ ozu nwaagbọghọ ahụ.

"Ya na enyi ya nwoke soro labaa n'ime ụlọ ndịna n'abalị ma ka ha nwechara mmekọ, enyi ya nwoke wee tọgbuo ya gbalaga."

"Mana anyị nwere olileanya na anyị ga anwụchi ya n'oge adịghị anya."

Nnamdi gara n'ihu kwuo na o nwebeghi onye ma aha nwaagbọghọ ahụ ganye na ndị nwe ya abịa.

Mana akụkọ si na soshal midia kwuru na aha ya bụ Maureen Ewuru, onye Abia steeti, mana BBC amatabeghi ma nke ahụ ọ bụ eziokwu.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: