Igbo Culture: Kedụ ndị bụ "Ụmụada" n'ala Igbo?

Ụmụada Image copyright Facebook/Nnarambia Women
Nkenke aha onyonyo Ụmụada bụ otu ụmụnwanyị kacha nwee ikike n'ala Igbo

Na mgbe gboo, e nwere otu ụmụnwaanyị dịgasị iche iche n'ala Igbo ndị ọrụ ha dịkwa iche iche.

E nwere ndị dịka otu nze na ọzọ, otu mmonwụ, otu ọgbọ, edz.

Mana otu n'ime ndị kacha nwee ikike bụ otu ndị Ụmụada.

Kedụ ndị bụ ụmụada?

Image copyright Facebook/Nnarambia Women
Nkenke aha onyonyo Ọ bụ ụmụwanyị niile a mụrụ n'obodo na-emebe otu ụmụada

Nwaanyị ọbụla a mụrụ n'obodo bụ ada n'obodo ahụ.

Ọbụrụgodu na nwaanyị alụọ di, ugwu ya ka kwụ chịm n'obodo a mụrụ ya.

Ọ bụ ụmụwaanyị niile a mụrụ n'obodo na-emebe otu ụmụada na-agbenyeghi obodo ebe a na-alụ ha.

Mana dịka Odoziakụ Celestina Obiejesi onye Obodoukwu n'Imo steeti siri kwu, nwaanyị alụghị di nwekwara ike isonye n'otu ụmụada.

Aha ọzọ e nwere ike ịkpọ ụmụada

Aha a na-akpọ ha abụchaghị otu n'obodo niile.

E nwere ndị na-akpọ ha ụmụada, ụfọdụ na-akpọ ha ụmụọkpụ ebe ụfọdụ na-akpọ ha ụmụ mgbọtọ, mana ha ncha pụtara otu ihe.

Ọrụ ndị ụmụada n'obodo

Image copyright Facebook/Nnarambia Women
Nkenke aha onyonyo Ụmụada na-ejịkọ Obodo

Dịka Nwokocha Benedicta Akuezi onye Ahiazu Mbaise siri gwa BBC, ọrụ ndị ụmụada buru ibu n'ala Igbo.

Ha gunyere, ịkpa udo, igbo mkpa, ikpebi ikpe siri ike, ịta onye dara iwi ahụhụ, ịkpa obioma, dgz.

O kwuru sị: "Ihe siwe ike, maọbụ nsogbu dị n'obodo nke amakwaghị ihe a ga-eme ya, a na-akpọ ụmụada ka ha bịa tinye okwu dị otu ahụ ọnụ.

Image copyright Benedicta Akuezi
Nkenke aha onyonyo Ụmụada anaghị ekpe ikpe ezighi ezi

"E nwere nkwenye na mgbe ọbụla ụmụada tinyere ọnụ n'okwu, okwu ahụ ga-eberịrị.

"Mana ọ bụrụ na ndị okwu ahụ dị n'aka achọghị udo, ụmụada nwere ike kụọrọ ha ọfọ maọbụ bọọrọ ha ike."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya

Akuezi kọwara ịkụ ọfọ dịka ihe a na-eme ka chi ndị obodo na-efe were aka ya taa onye ikpe mara ahụhụ.

"Onweghi onye ụjọ ga-ekwe ka ụmụada bịa kụọrọ ya ọfọ.

"Onweghikwanụ onye ọ ga-amasị ka ụmụada bị gbaara ya ọtọ.

"Ya mere na mgbe ọbụla ndị ụmụada kwuru okwu, a na-akwanyere okwu ha ugwu nke ukwuu."

Ihe ụmụada na-eri na ihe ha na-asọ

Image copyright Facebook/Nnarambia Women
Nkenke aha onyonyo Ụmụada bụ ndị na-akpa udo bụrụkwa ndị na-akpa obi ọma

Na mmemme ọbụla dịka nkwụnwaanyị maọbụ olili ozu, ihe oriri ụmụada na-apụ iche.

Ọ bụrụ na e gbuo ehi maka mmemme, a na-edowere ụmụada ukwu ya iche, ya na ihe oriri ndị ọzọ dịka akpụ, abacha, na mmanya pụrụ iche.

Emeghị otu a, mara na onye ahụ ekotela okwu n'ihi na ụmụada ga-ada ya nha.

Mana Celestina Obiejesi kwuru na ihe oriri anaghị ebutekarị esemokwu.

"Ụmụada ma ole aka ha onye. Ha anaghị asị ka e nye ha ihe ga-agbaji ndị na-eme ihe aka."

N'aka nke ozo, ụmụada na-asọ okwu asị, aghụghọ nakwa mmegbu.

Nwaada Igbo anaghị anọ ebe a na-ekpe ikpe ezighi ezi.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKirie egwu ndị nne gbara n'ụkanne

Mana nwaada ọbụla mehiere nwekwara ntaramahụhụ pụrụ iche ndị ada ibe ya ga-enye ya.

Obiejesi kwuru, "Nwaada ọbụla mejọọ, a ga-akpọ ya ikpe n'ọgbakọ ụmụada ma taa ya ahụhụ.

"Ahụhụ dị otu a nwere ike bụrụ ịchụpụ onye ahụ n'otu ha maọbụ machie mmekọrịta ya na ndị mmadụ n'obodo ihe ruru afọ ise."

Akụkọ ga-amasị gị: