Ndị gburu Paul Offu na Clement Ugwu nọzị anyị n'aka - Ndị uweojii Enugu

Ibrahim Adamu na Idris Tobe bụ ndi uweojii sị n'aka ha dị ogbugbu Fada Offu
Nkenke aha onyonyo Ibrahim Adamu na Idris Tobe bụ ndi uweojii sị n'aka ha dị ogbugbu Fada Offu

Ndị uweojii sị na ha ejidela ndị omekome gburu fada Paul Offu na ndị ọzọ gburu Fada Clement Ugwu.

Mmadụ abụọ a ejidere ma gosi ndị nta akụkọ maka ogbugbu Fada Offu bụ Ibrahim Adamu, onye gbara afọ 25 na Idris Tobe, dị afọ 28.

Onyeisi ndị uweojii n'Enugwu bụ Suleiman Balarabe kwuru na ha dị mmadụ ise aka ha dị ogbugbu fada Paul Offu, ma kwuo na ha jidere nanị mmadụ abụọ n'ime ha, ebe mmadụ atọ bụ Garuba Basulugu,

Mohammed Lagu nakwa Mojapan Duna riri mbọ mbọ ọsọ.

Nkenke aha onyonyo Ndị omekome ndị uweojii ji maka ogbubu Fada Offu n'Ugwu

Balarabe kwere nkwa na ya na ndị ọrụ ya ga achọpụtarịrị ndị niile gburu ndị fada n'Enugu ebe ọsọrọ ha gbaga.

Idris Tobe gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ọ bụ n'Enugwu ka amụrụ ya mana ya bi n'Okigwe ugbua.

Ọ gakwara n'ihu sị na aka ya adịghị n'ogbugbu Fada Offu.

Image copyright CPS Enugwu
Nkenke aha onyonyo Gọvanọ Enugwu gara njem ịleta gburugburu ebe ndị omekome na-akpa ike na mpaghara Ọgwụ

N'aka nke ọzọ, cheta na mmiri ribidoro ndị ntọrị gbagburu fada Clement Ugwu ka ndị uweojii jidere mmadụ atọ n'ime ha n'Lagos.

Ndị ntorị ogbu mmadụ ahụ ejidere bụ Sunday Chibuko 32, onye Ezeagu, Benjamin Asogwa 38, onye Obollo Eke nakwa Wasiu Ajomale, onye ogun state. Onye nke anọ a na-achọ achọ bụ Kelechi onye Oji River.

Wasui Ajomale kwetara hoo ha na ọ bụ ha gagburu fada Clement Ugwu. Lee akụkọ a n'uju Anyị ejidela ndị gburu Fada Clement n'Enugwu - Ndị uweojii

Ogbugbu ndị fada a, ntọrị igwe ndi Agbogugu nakwa mpụ ndị ọzọ kpatara ndị fada jiri mee ngagharịiwe n'Enugwu ma mekwaa ka ndị Fulani na-achị ehi họpụta ụbọchị abụọ iji gbasaa ozi.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtu esi gbuo Fada Paul Offu n'Ihe

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a