Nicki Minaj: ihe ise ị maghị maka nwada a na-apụ ọkụ

Nicki Minaj Image copyright Getty Images

Otiegwu mba Amerịka Ama ama bụ Nicki Minaj ekwuola na ya n'achịsa ọwa n'ihe e jiri mara ya.

Minaj onye kwuru nke n'ụbọchị Tọzde ekwughị ihe o ji ahapụ ọgbọ ugbua karịa na ya na-aga ibido ezinaụlọ mana o kwughị ma ọ dị ime.

Cheta na nsonso ọ gbara ama na ya na Kenneth Petty gara kwegharia nkwa alụm di na nwunye.

Ọkwa ahụ ọ mara adịghị ndị ihe ya na-amasị mma dịka ha wujuru soshal midia na-atụ arịrị maka ya.

Ihe ise ịmaghị maka ya:

Image copyright Getty Images

1. Ezi aha ya bụ Onika Tanya Maraj

2. Ọ bụ onye mba Trinidad na Tobago, a mụọ ya na mba Spen mana o toro na Amerịka

3. Onye egwu' rap' a ma ama maka efere egwu ya bụ 'Pink Friday'nakwa 'Pinkprint' esonyela n'ọtụtụ ihe nkiri dịka 'The Other Woman' na 'Ice Age: Continental Drift'

4. O nwetala ọtụtụ nturuugbo gụnyere nzere 'American Music Awards' isii, nzere BET Awards 11 nakwa 'MTV Video Music Awards' anọ.

5. Ụfọdụ na-eche na nwada e ji uwe ana-m-anụ-ihe nakwa ntutu na-apụ ọkụ mara ya nwere ike ọ bụụ ka ọ ga jikere were pụta ọzọ dịika kepukepu na-ekwu na ahịa ya anaghị erekwa ka mbụ.

Nnamdi Kanu: O nweghị mgbe m kwuru na m ga-akpọlata ndị Ipob nọ Saụt Afrịka

Image copyright Getty Image

Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu agọrọla isi onwe ya n'okwu na-efegharị na ọ ga-akpọlata ndị IPOB ọbụla nọ na Sawụt Afrịka na-efu maka okwu Xenophobia.

Onye aka nri ya bụ Paul Achalla ama a n'ekwentị mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ya.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIpob: Nnamdi Kanu ga-abata mgbe Naịjirịa dị njikere

N'ọnụ Achalla "Nnamdi Kanu agwala ndị Ipob ọbụla ha kwụsị ịga Naịjirịa kemgbe edenyere aha ha dịka otu ndị na-eyi ndụ egwu"

Okwu a na-abịa dịka gọọmentị Naịjirịa họpụtara ụgbọelu Airpeace iji bulata ụmụ Naịjirịa ọbụla chọrọ ịsi mba Sawụt Afrịka lọghachite.

EFCC anwụchiela otu ọkammụta na ndị ọzọ maka mpụ

Ụlọọrụ Efcc ekwuputala aha mmadụ iri na abụọ gụnyere otu onye ọkammụta na Mahadum Ahmadu Bello maka mpụ na igwu wayo.

Akpụpụrụ ndị a ụlọikpe ebe onye ọkaikpe nyere iwu ka ọkwụọ dọlla nde iri n'ụgwọ mgbapụta rue mgbe a ga-anụ ikpe ya ọzọ.

Aha ndị ahụ bụ Olaleye Kolapo, Madukife Ifeanyi Azuka, Fatanmi Yinka Sunday, Adebayo Bolaji Adeyinka, Adeleke Peter na Adebowale Fadairo.

Ndị ọzọ bụkwa Oyewunmi Toulope Michael, Bello Ayoade Jalal Arikalam, Owolabi Toheeb Toluope, Abdullahi Abdulazeez Oluwatobi, Temitope Fatolu na Adesina Adewale.

David Umahi agaala obi gọọmentị taa

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi agaala njem nleta n'obi ghọọmentị etiti bụ Aso Rock izute onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari.

Amabeghị ihe ndị ha ga-akpa mana ọ ga-apụta ihe n'oge adịghị anya.

Madagaska esorola nzọmụkwụ Zambia

Mba Madagascar esorola nzọmụkwụ mba Zambia n'ịsepụ ụkwụ ha n'asọmpị enyi na enyi dị n'etiti ha na mba Saụt Afrịka.

Madagaska mere nke a iji gosi uche ha gbasara okwu Xenophobia na-ewu na Saụt Afrịka.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Samson Siasia rụbụrụ ọrụ dịka onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Naijiria bụ Super Eagles n'afọ 2011

Samson Siasia bụ aka na-achịkọta bu otu egwuregwu bọọlụ Naịjrịa emeela mkpesa banyere mmachi ebighebi nke FIFA machiri ya.

O kwuru na mkpesa bụ iji gosi na aka ya kwụ ọtọ n'ebubo niile eboro ya.

Gee nkeji ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ọgbaaghaara Ịkpaoke agbụrụ

Image copyright Getty Images

Ozi na erụ anyị ntị ugbua na-akọwa na gọọmentị mba Saụt Afrịka emechiela ụlọọrụ nnọchite anya ha dị na Legọs, Naịjirịa.

Ha sị na ọ bu maka ịchekwa ndi ọrụ ha dịka ngagharị iwe emere na Legọs butere ndị mmadụ ịwakpo ulọ ọrụ ndị ha sị ndị Saụt Afịrịka nwe.

Nke a na-abịa n'azụ Naịjirịa kpọlatala onye nnochite anya ha na Saụt Afịrịka.

Naịjirịa gbajọkwara nzụkọ ngalaba "World Economic Forum" Osote Onyeisiala Osinbajo kwesiri ịnọ na ya.

Airpeace wepụtara ụgbụọelụ maka nnọlata

Dịka ịkpaoke agbụrụ nke Saụt Afrịka na-aga n'ihu, Ụlọọrụ ụgbọelụ Airpeace ekwụọla na ha ga-eweputa ụgbọelụ maka ndị Naịjirịa niile chọrọ ịlọta.

N'akwụkwọ ọ degara Minista na ahụ maka mekọrịta ndị mba ọzọ bụ Geoffrey Onyema, onyeisi ọrụ Airpeace bụ Oluwatoyin Olajide kwụrụ na agaghị agba nkiti ka ya bụ ewụ mụọ n'ọgbụ.

Ụlọikpe awụọla Exxon Mobil na Shell n'ala

Image copyright Getty Images

Ụlọikpe n'Amerịka awụọla Exxon Mobil na Royal Dutch Shell n'ala gbasara akwụkwọ ha gbara ụlọọrụ mmanụ agbidi Naịjirịa bụ NNPC.

Exxon Mobil na Shell rịọrọ ya bụ ụlọikpe ka ọ manye NNPC ka o kwụọ nha otu ijeri dọla na ụma asatọ maka na ọ mezughị nkwa ha ịmịta mmanụ n'afọ 1993. Mana ụlọikpe jụnyụrụ anya pịị.

Ụlọikpe atụọla nwụnye onyeisiala mkpọrọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rosa Elena Bonilla

Leekwanụ na-atụọla nwụnye onye chiburu Honduras bụ Rosa Elena Bonilla nga afọ iri ise na asatọ maka mpụ na oke ego asị na omefuru mgbe dị ya nọ n'ọchịchị site n'afọ 2010 ruo 2014.

Ọkaiwu ọrịakụ Bonilla na-ekwusi ike na aka ya bụ nwaanyị dị ọcha na ya ga-aga ụlọikpe mkpegharị iji zọpụta ya na ndagwuru nke ọnwu.

itozuoke iko mbaụwa 2022 ebiriala ọkụ

Image copyright Getty Images

Asọmpi itozuoke iko mbaụwa 2022 malitere n'ikem n'ikem ụbọchị Wenezde, mba iri abụọ na asatọ ọkpa esicheghị ike n'Afrịka ga-anwa ike ha maka isonye.

Cheta na Naịjirịa na mba iri abụọ na isii ndị ọzọ nke Afrịka etozuolarị na echezi ibe.

Nkeji Igbo

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Akụkọ ga-amasị gị