Ndị kọmishọna Anambra akwọọla aka 'Pilate' gbasara ụlọ dara n'Ọnisha
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Onitsha Building Collapse: Gọọmenti nwere ụta maka ụlọ na-ada - Ọkacha mara n'ịrụ ụlọ

Onye ọkachamara n'irụ ụlọ bụ Njinịa Ikechukwu Ijiomah ekwuola na ụta dịịrị gọọmentị Anambara maka ụlọ dara n'Ọnịtsha n'ụbọchị Wenesdee.

Nke a na-abịa dịka ndị Kọmishọna na-ahụ maka ịrụ ụlọ nakwa nke na-ahụ maka gburugburu na steeti ahụ gọọrọ isi onwe ha na ya bụ ọdachi.

Ijioma kwuru na ọtụtụ ihe nwereike ịme ka ụlọ daa, ọ nwere ike ị bụ na ọkpụisi amaghị akpụ maọbụ na agụba adịghị nkọ.

Ọ kọwara na eleghị anya, ọ bụrụ na ala ebe a rụrụ ya bụ ụlọ esichaịghị ike.

N'okwu ya: "E kwesiri inyocha ihe ndị a niile tupu a mata ebe ya bụ mmiri sị baa n'opi ụgbọgụrụ."

"Gọọmenti nwere ezigbo ụta maka ya bụ ụlọ na-ada maka na ọ bụ ọrụ ha ịnyocha ndị Njinia na-arụ ọrụ ụlọ tupu e nye ha ikike ịrụ ọrụ.

"Gọọmenti kwesikwara inyocha ebe ọbụla a na-arụ ụlọ ịmata ma ebe ahụ ekwesiri ịrụ ụlọ."

Gee ihe ndị ọzọ okwuru n'ihe nkiri anyị.

N'aka nke ọzọ, ndị kọmishọna BBC Igbo kpọtụụrụ enyeghị ezi ọsịsa maka ụlọ ahụ dara n'ogbe Nkisi Alori n'Ọnisha.

Kọmishọna nke okwu gburugburu dị n'aka bụ Obi Nwankwọ gwara anyị na ọbụghị ụlọọrụ ya na-ahụ maka ụdị ihe ahụ.

Mgbe anyị kpọtụụrụ Kọmịshọna na-ahụ maka iwu ụlọ bụ Mike Okonkwo, o kwuru na ọbụghị ya ga-aza ajụjụ ahụ.

Matakwa na ọbụghị naanị ụlọ ahụ dị na nkịsị dara n'abalị Wenezdee.

Mgbaaja ụlọmkpọrọ dịkwa n'Ọnisha dakwara n'otu abalị ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti kwuru na onyeisi ndị uweojii bụ John Abang gara jiri anya ya hu ka ya bụ ihe si mee.

Ha sị na ọ bụ oke idemmiri so mmiri ozuzo kwaturu ya bụ ụlọ dị na Nkisi Alori.