Champions League Results: Njọ ahịa akpọọla Chelsea na Liverpool ihu

E meriri Liverpool 2-0, merie Chelsea 1-0 Image copyright Reuters

Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea na Liverpool ejirila njọ ahị malite asọmpi Champions League nke afọ 2019/2020.

Otu bọọlụ Valencia si mba Spen wee bịa were otu ọkpụ goolu gbachie ndị Chelsea ọnụ.

Ebe otu Napoli nke mba Ịtali jị ọkpụ goolu abụọ asataghị asata gwa ndị Liverpool na nwoke na ibe ya ha bụ n'ọnụ.

Liverpool bụ ndị buliri iko Champions League nke afọ 2018/2019.

Image copyright Getty Images

Ndị ọkacha mara na-ekwukwa na igwe 'Video Assissted Referee' (VAR) kwesịrị ịkagbu penariti Valencia ji nye Liverpool goolu nke abụọ.

Mana ọtụtụ kwuru na Liverpool jiri ụkwụ a gawa, ọdịghịkwa ka e nwere ihe ga eru ha aka n'afọ a.

Image copyright Getty Images

N'aka nke ọzọ, Chelsea nwetara ohere ịsa otu ọkpụ goolu Valencia nyere ha, mana Ross Barkley gbafuru penariti e nyere ya na nkeji iri itoolu na ụma.

Nke ka njọ bụ mgbe Mason Mount merụrụ ahụ wee tụrụ ụkwụ pụọ.

N'asọmpi Champions League ndị ọzọ a gbara n'abalị Tuuzde, Barcelona na ndị Borussia Dortmund gbara onwe ha onye lawa onye lawa.

Image copyright Twitter/@ChampionsLeague
Nkenke aha onyonyo Lionel Messi so Barcelona gbaa taa, mana nke a enyeghị ha mmeri.

Ajax ji ọkpụ goolu atọ nyụọ ndị Lille nke mba Fransị ịkpakwụ.

Ndị RB Salsburg ji ọkpụ goolu isii asatara abụọ menyụọ ndị KRC Genk anya.

Lyon na Zenit St Petersburg nyere onwe ha ọtu ọkpụ otu ọkpu.

Ebe Inter Milan na Slavia Prague gbakwara otu ihe ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAwgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo