Border Closure: 'Rice akọọla n'ahịa n'ihi mmechi border' - Ndị ahịa

Nwanyị na-azụrụ osikapa n'ahịa
Nkenke aha onyonyo Nwanyị na-azụrụ osikapa n'ahịa

Ọtụtụ ụlọahịa ebe a na-ere osikapa n'ahịa 'Mile One' nke dị na Pọtakọtụ emechiela kamgbe gọọmentị etiti mechiri okeala Naịjirịa na mba ndị gbara ya gburugburu iji kwụsi ịtụbata osikapa mba ofesi.

Onyeisi otu jikọrọ ndị na-ere osikapa n'ahịa ahụ bụ Anselm Nwachukwu gwara BBC na ihe kpatara nke a bụ maka na ha ahụghị osikapa zụta.

Nwachukwu kwuru sị: "Mmechi 'border' a metụtara ahịa anyị nke ukwuu."

"Ọ dịghị m ka gọọmentị etiti echere ihe a ọfụma tupu ha emechie oke ala."

"Ha kwesịrị ịgbalị hụ na nri dị n'uba tupu ha emechie ya."

Nkenke aha onyonyo Anslem Nwachukwu, onyeisi ndị na-ere osikapa n'ahịa 'Mile 1' Pọtakọtụ.

N'otu aka ahụ, Emeka Okameme, onye na-atụ mgbere osikapa kwuru na ahịa ha na-agbada agbada ugbua.

O kwuru sị: "Osikapa adịghị, ma nke Naịjirịa, enweghị nke dị."

"Mgbe ha mechiri 'border', anyị che na anyị ga-ahụ osikapa Naịjirịa, mana onweghị nke anyị hụrụ."

"Ihe nke a gbara anyị gharịị nke ukwu."

Nkenke aha onyonyo Akpa osikapa ebuzihi ibu n'ụlọahịa

"N'oge mbụ, anyị na-azụ otu akpa osikapa mba ofesi puku naịra iri na isii maọbụ iri na asaa, ebe nke Naịjirịa bụ puku naịra iri na anọ."

"Ugbua, osikapa Naịjirịa bụzi puku naịra iri abụọ na ise, mana ọnweghị onye na-ahụ ya."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNigeria Boarder closure: 'Mmechi bọda agaghị egbo mkpa ọbụla' - Cosmas Maduka

Njọ ahịa a rutụkwara ndị na-ere ihe nri ndị ọzọ n'ahịa ahụ.

Okey Nnadi onye na-ere ọkụkọ kwuru na ọbụrụ na ndị mmadụ bịa ịzụrụ osikapa, ha na-azụkwa ihe ndị ọzọ, mana ugbua, njọ ahịa jizi ma onye ukwu ma onye nta.

Nnadi rịọrọ gọọmentị ka ha leba okwu mmechi oke ala ahụ anya ka ahụhụ ghara igbu ndị mmadụ tupu mmemme ekeresimesi eruo.

Ndị n'ọchị, ndị n'akwa

Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ụlọahịa n'ahịa 'Mile 1' mechiri emechi.

Mana ndị na-ere ọka kwuru na mmechi okeala Naịjirịa mere ka ọnụego akpa ọka gbalie.

Akpa ọka a na-erebu puku naịra ise bụzị puku naịra itoolu ugbua.

Onyeisi otu jikọrọ ndị ọrụugbo na-akọpụta ọka bụ Bello Abubakar Funtua kwuru na onyeisiala Muhammadu Buhari mere nke ọma.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụubi na-akọpụta ọka

Funtua kwuru na ndị otu ha kọpụtara ọka karịrị nde 'tonne' iri abụọ (20m toones) n'afọ gara aga.

O kwuru na ha nwere ọka n'uju maka ụlọọrụ ji ọka arụpụta ihe dị icheiche ka ha bịa zụrụ.

N'okwu ya, "Anyị nwere ngalaba ha na gọọmentị na-arụkọ ọrụ iji hụ na ego akpa ọka arịghị elu karịa ka ọ dị ugbua."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionInnoson Motors: Etu m si bido ịgba mbọ