Nigerian Celebrities: Lekwa ihe mere ka ndị a ama ama wuo n'ízu a

Ndị ama ama anọ

Ebe foto si, Davidoofficial/Kim Kardashian/Chizzy Alichi

Dịka izuụka a na-abịa n'isi njedebe, anyị na-ewetara gị ihe ndị ama ama ụfọdụ mere nke dara ụda.

DAVIDO

Ebe foto si, @Davido

Obi bụ Davido sọ anụri dịka enyị ya nwaanyị, Chioma mụrụ nwaa nwoke na Sụnde gara aga.

Kama ndị osochiegbu bịara ime ya obi ọjọọ mgbe ha boro ya ebubo na ọ tụwara otu n'ime ha ime.

Ụmụagbọghọ a mechara kwugharịa si na ha na-ama ya njakịrị.

Ha rịọkwara Davido ka ọ gbaghara ha na ọ bụ egwuregwu.

Kama Davido sị 'Njakịri laa azụ' ha ka atakwute ya kọnkịrị n'ụlọ mkpọrọ.

Okey Bakassi

Nkọwa foto,

Okey Bakassi gbara afọ iri ise n'ụbọchị Wenesde.

I mara afọ ole Okey Bakkassi dị?

Otụtụ amaghị mana nwoke a agbaala afọ iri ise.

Bakassi mezuru ya afọ iri ise ọnọọrola n'elụ uwa n'ụbọchi Wenesde gara aga.

Lekwa ụfọdụ ozi ekele ezitere ya.

Meghan Markle,'Duchess of Sussex'

Ebe foto si, sussexroyal

Harry na Meghan bụ aha nọ ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ n'izu a.

Ha abụọ bụ Duke na Duchess nke obodo Sussex dị na mba Ịmgland.

Ụfọdụ kwuru nke di mma ebe ụfọdụ kwuru njọ maka ha.

Mana Meghan akatọọla etu ndị ntaakụkọ si ebu akụkọ maka ndụ ya na ezinụlo ya.

Lee ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ya -

KANYE WEST

Ebe foto si, Kim Kardashian

Nkọwa foto,

Egwu Kanye West tipụtara mere ka #Jesusislord wuwe na Soshal Midịa

Kanye West wuru na Sọshal Midịa maka egwu ọhụrụ o tipụtara, ọkachasị nke ọkpọrọ 'Jesus is Lord'.

Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ya.

FRODD

Ebe foto si, callme_frodd

Frodd onye ezigbo aha ya bụ Chukwuemeka Okoye gọsipụtara obi mwute o nwere dịka ọ gara leta ndị Onịcha ọkụ tanka gbara metụtara.

Lee ihe ekwuru maka njem ya na Twitter

CHIZZY ALICHI

Ebe foto si, Chizzy Alichi

Nkọwa foto,

Chizzy Alichi na ndị BBC

Nwaada a makarịrị 'mamiwọta' na mma biara nọnyere BBC Igbo n'ụbọchị Fraịde.

O sonyere n'ihe omume anyị a kpọrọ 'Gịnị na-afịọ'.

Lee ka o siri gaa.

Akụko ga-amasi g

Ihe nkiri ga-amasi g:

Aha onyonyo,

'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'