Benue State: 'Onyeisi ndị Miyetti Allah ekwuruola ọnụ'

Samuel Ortom sị ka anwuchie Bodejo

Image copyright Getty Images

Nwanna ị nụrụ nke na-akpọtụ na Benue?

Gọvanọ Samuel Ortom nke Benue agwala onyeisiala Muhammadu Buhari ya nwụchie onyeisi ndị Miyetti Allah bụ Abdullahi Bodejo.

Ortom sị na Bodejo na-ekwu ihe nwere ike ibute ọgbaghara n'obodo dị ka ọ sị na gọvanọ ọbụla chọrọ udo ga-amapụtarịrị ndị ọchị ehi ogige ha akpọrọ RUGA.

N'akwụkwọ nke odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Terver Akase deputara ụnyahụ bụ Sọnde, Ortom sị na Bodejo gwara ndị gọvanọ ọbụla na-ewepụtaghị ala maka RUGA chee aka ghọrọ ya.

Dịka ọ dere, " iburu gọvanọ ma iweputaghị ala maka RUGA, ị gaghị enwe udo na steeti gi".

Ortom sị na ya bụ okwu were ike ịkpalite mmụọ ọgbaghara n'ime ndị mmadụ ma bụkwara mgbaama maka ihe ha na-echere ha n'ọdịnihu na Benue.

O kwukwara na onweghị otu ọbụla kwesiri ịkarị iwu obodo.

Otrom sị "anyị na-akpọkụ ka gọọmentị jide ya bụ nwaamadị ma maa ya ikpe ka iwu si di".

Cheta na ndị otu a maraọkwa mwakpo obodo Guma na Benue n'ụbọchị bọrọ afọ ọhụrụ 2018.

NLC echerela ndị gọvanọ aka mgba

Image copyright AFP

Ị nụrụ maka ụgwọọnwa opekatampe nke ndị steeti?

Odeakwụkwọ ndị Nigeria Labour Congress bụ Emmanuel Ugboaja na-arịọ ndị omeiwu steeti niile ka ha gbaara gọvanọ ọbụla kpọrọ ekwo nkụ maka ya bụ ụgwọọnwa ụgbọ nwamkpi.

O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ ụbọchị ụka.

Dịka Ugboaja kwuru, " Gọvanọ ọbụla na-ekweghị ịkwụ ụgwọ opekatampe sị chutuo ya n'ọkwa".

Cheta na otu jikọrọ ndị gọvanọ ekwubuola na ha enweghike ịkwụ karịa ka ha nwere ike.

Ụgbọaja sị na ya ahụghị ihe ndị gọvanọ ga-eji sị na ha agaghị akwụli ya bụ ụgwọ maka na ha ga-emeli ya.

Ọ sị na "ọ bụ arụ ị sị na ị gaghị akwụ ya bụ ụgwọ ebe ụfọdụ n'ime ha nwere ụgbọelu naani ha na-aba".

Ogbunigwe adaala ndị ISWAP

Image copyright NAF

Ndi aghaụgbọelụ atụọla ogbunigwe na ọdọ ebe ndị Islamic State for West Africa bụ ndị ọmekataraihe puo ụjọọ nọ na Arrinna Ciki dị na Borno steeti.

Akụkọ na-ekwu na ya bụ agha ha busoro ndị ọlụọ ọlaa ahụ ụbọchị Fraịde na Satọde gburu ọtụtụ n'ime ha.

Ndị aghaụgbọelu nke Operation Lafia Dole sị na ndị otu ha na-ahụ na mmụọ nyopuru ụgbọala ndị omekome ahụ ka ọ na-agba were gbaara ha ama.

Ọnụ na-ekwuru ndịagha ahụ bụ Commodore Ibikunle Daramola kwuru n'ụbọchị ụka na ndị ọjọo ahụ ji ebe ahụ mere ọnọdụ mwakpo ha.

Commodore Daramola sị na ha mebiri ndị ọlụọ ọlaa ahụ ihe nke ukwuu.

Ikuku ndụ dizi okeọnụ na Delhi

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ikuku ndụ bụzị ikuku onwu na Delhi

Ị nụkwara na ndị mmadụ anaghịzị ahụ ezigbo ikuku na Delhi dị n'India?

Minista na ahụ maka isiobodo ha bụ Arvind Kejriwal etiela mkpu na ajọ ikuku sị na ụgbọala nakwa ụlọọrụ anaghịzị ekwe mmadụ kụrụ ikuku ndụ.

A nụrụ na ọ sị na gọọmentị ha amalitela ịwepu ọtụtụ ụgbọala n'ụzọ. iji mee ka anwụrụ ụgbọala beleta n'ikuku.

Anwụrụọkụ ekweghị ụgbọelu iri atọ febata ụbọchị ụka.

Iwu ha tiri ugbua bụ na a ga-amalite ike ụbọchị ụgbọala ọbụla ga-eji agba n'ụzọ.

Nke bụ ka ewere beleta ụgbọala n'ụzọ.

Akwụsịla ọrụ ma ụlọakwụkwọ na Delhi ruo Tuzde.

Minista ahụike na mba ahụ bụ Satyendar Jain agwala ndị mmadụ ka ha gbakpuo n'ụlọ ha ọkachị n'ụtụtụ nakwa mgbede.

A chọpụtara na ihe sọ agbachụ ihe eligwe bụ ọkụ ndị ọrụugbo na-agba ahịhịa maka nkwado ọrụugbo.

Oyi atụọ Niko Kovac

Image copyright ALLSPORT/Getty Images
Nkenke aha onyonyo Niko Kovac malitere ịchị Bayern kemgbe Julaị 2018

N'egwuruegwu, Niko Kovac abụghịzị ọnye nkuzi ndị Bayern Munich.

Nke a sitere na ọkpụ ise Eintracht Frankfurt gbara ha na Bundesliga ụnyahụ bụ Sunday.

Bayern satara naanị otu ọkpụ n'ime ya.

Nke a bụ ogburu abụọ emeriri Bayern na sizinu a.

N'agbanyeghị, Kovac na ahapụ Bayern Munich mgbe ha ruru nkatụ nke anọ n'ogogo lig ha bụ nke Borussia Monchengladbach nọ n'isi ha.

Kovac bụ onye gbara afọ iri anọ na asatọ emeriela asọmpị iri anọ n'ime iri isii na ise ha gbagoro.

Mana anyụbeghị ha ụdị ịkpakwụ a ndị Borussia Monchengladbach nyụrụ ha n'ime afọ iri gara aga.

Bayern sị na ọchụchụ Kovac bụ nkwekọrịta ha na ya.

Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Akụkọ ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNollywood: E gwuru m chandum mgbe m bidoro - Obi Emelonye

Isiokwu Ndị Emetụtara