Imo Budget: Ihedioha eweputala Bojet 2020 nke steeti Imo

Emeka Ihedioha Image copyright Imostatemedia/Instagram

Gọvanọ na-achị steeti Imo bụ Emeka Ihedioha nọoro ta n'ulo omeiwu steeti ahụ ma gbaa n'anwu, bụ atụmatụ mkpata na mmefu ego nke afọ 2020.Atụmatụ a, bụ nke ọ kpọrọ 'atụmatụ Bojet nke ịrụzigharị steeti Imo nke mbụ' bụ nke pụtara ijeri naira 197,607,272,328.

Lee etu e si gbari ya bu ego ebe a:

- Ego a ga-emefu n'ọrụ ọhụrụ - ijeri naịra 106,229,450,200 - Ego a ga-emefu n'ọrụ ochie - ijeri naịra 91,377,822,128 - Ego a ga-emefeu n'ọrụ - ijeri naịra 41,381,250,95.

Ihedioha kọwara na isi sekpụ ntị na bọjetị a bụ ịwụgharị Imo steeti ka ọ dịrị etu ọ dị na mbụ.

Ndị ntọ atọrọla Fada ọzọ n'Enugwu

Image copyright Getty Images

Fada Malachy Asadu abụrụla fada ọzọ ndị ntọ tọrọ n'Enugwu kemgbe afọ 2019.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị ụweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu gwara BBC Igbo n'ekwentị na atọrọ Asadu na mpaghara Nsukka.

O kwuru na ndị uweojii jisike eme nyocha ka ha chọpụta Fada ahụ atọrọ kemgbe ụbọchị Monde.

A tọrọla ihe karịrị Fada Katọlik iri n'Enugwu kemgbe afọ a, agbapụtala ụfọdụ ebe ụfọdụ nwụrụ n'aka ndị ji ha.

Gọmenti Ebonyi sị na ndị nwereonwe Biafra anọghị ebe ahụ

Image copyright EBONYI GOVERNMENT

Gọọmenti Ebonyi steeti ekwuola na ọnweghị otu nwereonwe Biafra nọ na steeti ahụ.

Kọmishọna na-ahụ maka nchekwa na okeala bụ Stanley Emegha gwarakwara ndị nta akụkọ nke a mgbe ọ gọrọ na ọnweghị otu Bakasi Boys nọ ebe ahụ ịlụsa otu nwereonwe Bịafra ọbụla ọgụ na Steeti ahụ.

Emegha sị na onweghị ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) maọbụ ndị otu ọzọ na-alụọgụ nwereonwe Biafra nọ na ya bụ steeti ma ọlị.

Okwukere na-onweghị ndị otu ehibere dịka Bakasi Boys maka ịmeru otu otu ndị nwereonwe.

O wuru na soshal media na otu na e hibere otu Bakassi Boys ka ewere buso otu nwereonwe Biafra aha maka mgbagha ha na-agbagha atụmatụ RUGA n'ọwụwaanyanwụ.

Mana gọọmenti Ebonyi steeti sị na nke a bụ ọkpụrụkpụ asị.

Kọmishọna nchekwa na okeala kwuru na "ndị mmdụ nwere ike ị nọ n'ụlọ ha na-ekwu na ha bụ nke a maọbụ nke ọzọ, mana gọọmenti Ebonyi steeti amaghị ndị ha bụ, n'ezie".

Obiano na ọdọugboelu Anambra steeti

Image copyright GovernorObianoFacebook
Nkenke aha onyonyo Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ

Ndị Anambra ṅụrịa na ihe ọnụ emeela.

Gọvanọ Willie Obiano ekwuola na ya ga-arụcha ọdọụgbọelụ Steeti ahụ n'ọnwa iri na asatọ.

Obiano kwere nkwa a ka ha na ndị ji ego achụ ego na-ezuko n'Amawbia, ụnyaahụ.

EFFC na Diezani Alison Madueke

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Diezani ka na-agọ ebubo dị ya n'isi

Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka bụ EFCC akatọọla akụkọ kwuru na ha esepula aka n'ebubo mpụ ha boro onye bụbu minista mmanụ agbịdị bụ Diezani Alison Madueke.

Ọnụ na-ekwuru ụlọorụ a bụ Wilson Uwujaren kwuru na akụkọ ahụ bụ asị gbara ọkpụrụkpụ.

A ga-egbu isi ndị mgbuisi an Bangladesh

Image copyright Getty Images

A maala mmadụ asaa ndị ọlụọ ọla ụkọ Alakụba ikpe ọnwụ maka mkpamkpa ha kpara na Bangladesh2016.

Mmadụ iri abụọ na abụọ nwụrụ maka ogbunigwe ha gbara n'ụlọnkwari na Dhaka.

Kedu olile anya Rohr

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles

Nchịkọta egwuregwu ndị Nịajirịa bụ Gernot Rohr sị na ọ bụ n'ọnwa Januwaị 2020 ka ya na onyeisi NFF ga-anọkọ kpaa maka ọdịnihu ya na Super Eagles.

Cheta na Rohr nọgoro afọ atọ n'ọrụ ya sị na obi juru ya afọ na ngbawe owetere na n'otu ahụ.

Nga mkpụrụọka na-eche ndị nrụrụaka ndọrọndọrọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye a tụrụ ịga

Ndị ntọ na ndị nrụrụaka ndọrọndọrọ ọchịchị kee nkwụcha maka akamgba ndị gọọmenti.

Ndị ụlọomeiwu ukwu amalitela ịme ka ewelie afọ ole ndị omekaome a ga-anọ na mkpọrọ.

Anyị nụrụ na ndị ntọ ga na-agazị nga mkpụrụọka ma ya bụ iwu malite ị dị ire karịa afọ iri ka ọ dị ugbua.

N'otu aka ahụ ka ndị omeiwu ahụ ji chọkwa ịkpatụ iwu gbasara ịwakpọ nwaanyị nke ndị na agba nke 357 n'akwụkwọ iwu Naịjiria.

Onye kwulitere nke a bụ Oluremi Tinubu bụ onye chọrọ ka e tinye ụmụnwoke ma e kwuwe okwu nwakpo n'ihi na ọ bụghị naani nwaanyị ka a na-awakpo.

Trump nwere ike ịbịa zara ọnụ ya

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha

N'ofesi, Onyeisiala Trump nwere ohere ị bịa zara ọnụ ya, maọbụ kwụsị mkpesa maka nyocha a na-eme ya.

Ọ bụ onyeisi kọmiti na-eme ya bụ nyocha bụ Jerrold Nadler sị na ya nyere Trump ụbọchị anọ nke ọnwa Disemba ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo a na-ebo ya maka ịkwanye ndị Ukrain ka ha nyocha Hunter Biden.

Lewandowski akụwala efere nrite na Champions League

Image copyright Reuters

N'egwuregwu, Robert Lewandowski abụrụla onye kacha nye goolu ngwa ngwa na Champions League.

Ọ eziokwu. Ya bụ nwaadị na-agbara Bayern Munich nyere goolu anọ na nkeji iri na anọ n'ime goolu isii ha ji merie Red Star Belgrede na asọmpi ha ụnyahu.

Gee akụkọ ndị n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Akụkọ ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChukwuemeka Ezeife sị na ihe kara ndị Igbo mma kitaa bụ 'restructuring'.