'Ipob ebuteghị ọgbaaghara n'Oraifite' - Ifeanyi Ejiofor

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIfeanyi Ejiofor

Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor akọwala BBC Igbo akụkọ nke ya maka ọgbaaghara dapụtara n'obodo Oraifite, n'ụlọ ya bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu, n'izuuka atọ gara aga.

Na mkparịtaụka Ejiofor, ọ gwara BBC n'ekwentị n'ụbọchị Fraide na ọ bụ Emeka Offor zitere ndị uweojii ka ha bịa gbuo ya.

Ejiofor sị na o ji ihe akaebe gosiri n'ezie na Emeka Offor chọrọ iwepu ndụ ya, mana oge erubeghị mgbe ọ ga-agba ya n'anwụ.

BBC Igbo kpọtụụrụ Ebuka Obi bụ onye enyemaka mgbasa ozi Emeka Ofor mana o kwuru na ihe niile Ejiofor kwuru bụ asị ọcha.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOraifite Killing: 'Anya hụrụ Ifeanyi Ejiofor na ndị otu ya gwa anyị'- Uweojii

Ndị uweojii na ndị a na-eche na ha bụ ndị otu 'Indigenous People of Biafra' takọrọ isi na be Ifeanyi Ejiofor n'abalị mbụ nke ọnwa Disemba.

Ndị uweojii kwuru na ndị otu ha mmadụ abụọ nwụrụ na ọgbaaghara ahụ.

Mana Ifeanyi Ejiofor kwuru na ndị uweojii gburu mmadụ anọ ebe ahụ.

Image copyright Facebook/Ifeanyi Ejiofor
Nkenke aha onyonyo Ifeanyi Ejiofor

O kwukwara na mgbọ tụrụ nne ya n'ụkwụ oge ọgbaaghara ahụ dara.

Cheta na ndị uweojii ekwubuola na ọ bụ ndị mmadụ wetara mkpesa megide Ejiofor nke mere ha ji gaa be ya ịnwụchi ya n'ụbọchị ahụ.

BBC kpọtụkwaara Haruna Mohammed, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii maka ebubo ọhụrụ a Ejiofor boro ha, o kwuru na ọkaiwu ahụ bụ asịrị ka ọ na-akụ.

Maka ebubo na ya na ndị Ipob na-arụkọ, Ejiofor gọrọ na o nweghị ndị Ipob ha na ya na-arụ.

Ọ sị na ndị nọ na be ya bụ ndị ọrụ na-arụrụ ya ụlọ.

Image copyright Ifeanyi Ejiofor
Nkenke aha onyonyo Ifeanyi Ejiofor na-ebo na ọ bụ ndị uweojii gbara ụlọ ya ọkụ, ma ndị uweojii na-agọ

O bokwara ndị uweojii ebubo igbu mmadụ anọ na be ya, were buru mmadụ abụọ ha mataghị aha ha were pụọ.

Mmadụ abụọ ndị nke ọzọ ha huru ozu ha n'ohia bụ Mathew Okoro naIzuchukwu Nwatu.

O bokwara ndị uweojii ebubo ịgba ihe uru ụlọ obibi na ụlọahịa ruru iri abụọ oku n'ogbe ya.

Image copyright Ifeanyi Ejiofor

Ejiofor kwuru na ihe ya jiri lọta bụ maka akwamozu emere na be ha bụ nke emechererị mgbe ya bụ ọgụ dara n'ebe ọzọ.

Ọ sị na ọ bụghị na be ya ka ndị Otueke na ndị ọzọ nụwara ọya bụ ọgụ.

Ejiofor sị na o nweghị ihe jikọtara ya na ndị Otueke karịa na ọ bụ ya bụ ọkaiwu tinyere aha ha na akwụkwọ nke gọọmenti.

Image copyright Ifeanyi Ejiofor
Nkenke aha onyonyo Ifeanyi Ejiofor sị na ihe a bụ ụlọ ya ndị uweojii mebiri

N'ọsịsa ndị uweojii nyere, ha sị "Ọ bụrụ na Ejiofor ma na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu, ya nyefee onwe ya n'aka ndị uweojii ka anyị wee mee nnyocha zuru oke.

Ejiofor gwara anyị na ụlọikpe enyela iwu ka ndị uweojii ghara ịnwụchi ya ọzọ ruo mgbe ekpebiri ikpe.

Mana Haruna kwuru na ndị uweojii enwetabeghi akwụkwọ dị otu a n'aka ụlọikpe ọbụla bụ nke Ejiofor gosiri BBC.

Image copyright Ifeanyi Ejiofor
Nkenke aha onyonyo Ihe Ifeanyị Ejiofor kwuru na ndị uweojii mebiri na be ya

Gịnị na-esere Ifeanyi Ejiofor na Emeka Offor?

Ejiofor kọwara na e nwere ọrụ ya na Emeka Offor rụkọrọ n'afọ 2006.

O kwuru na ọ bụ ya na Mathew Igbokwe, lagoro mmụọ, so wee rụọrọ Emeka Offor ọrụ ahụ na mba Sao Tome.

Mana mgbe a kwụrụ ụgwọ, Emeka Offor enyeghi ha oke nke ruru ha.

Ihe Emeka Offor sara

Ebuka Obi, onye enyemaka mgbasa ozi Emeka Offor ziteere BBC ozi.

O kwuru na ihe niile Ejiofor kwuru bụ asị kpụ ọkụ n'ọnụ.

N'okwu ya, "Gịnị kpatara na ọ bụ ugbua ndị uweojii na-achọ ya achọ ka Ejiofor na-ebo ebubo a?"

"Gịnị mere na ọ gaghị kpesara ndị uweojii kamgbe?"

"Emeka Offor bụ onye oji ego achụ ego a ma ama; ọ naghị etinye aka n'ihe ọbụla ezighi ezi n'iwu."

"Ọkaiwu Ejiofor kwesịrị ịga zara ọnụ ya n'aka ndị uweojii ghara itinye aha Emeka Offor na ya."

Akụkọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe omimi dị na-iru isi dada

Isiokwu Ndị Emetụtara