Arochukwu myths& legends: Ihe asaa e ji mara ndị Arochukwu

  • Uche Akolisa
  • BBC Igbo, Lagos
Ndị Arochukwu

Ebe foto si, Ikeji Aro

Nkọwa foto,

Ndị Arochukwu bụ ndị eji omenala mara

Arochukwu so na nnukwu obodo dị n'Abịa steeti e jikwa 'Aro okeigbo' mara.

Ha bụ obodo a na-anụ aha ha n'ihi ihe gbasara azụmahịa na mmepe obodo mana ihe e jiri marakachasị Arochukwu bụ omenala.

Lee ihe ndị kara aka e ji mara ndị Arochukwu dịka ụmụafọ ha abụọ bụ Linus Nwagbara nakwa Zubi Okafor siri kọwaa:

1. Ibini Ụkpabi

Ndí Aró ejighí omenala egwu egwu
Nkọwa foto,

Ndị Arọ ejighị ihe omenala egwu egwu

O nwere ike ọ bụrụ na ịnụla maka 'Long Juju' nke Arọchukwu oge ị na-agụ akwụkwọ Praịmari maọbụ sekọndrị.

'Long juju' bụ ihe Bekee kpọrọ alụsị ndị Arochukwu nke ezigbo aha ya bụ Ibini Ụkpabi.

Arụsị a bụ ebe ndị nwere ikpe banyere ebubo igbu mmadụ, inye nsi, ịta amusu maọbụ esemokwu ezinaụlọ maọbụ obodo na-ebuga ikpe ha.

2. Agha Ar na Briten

Aha onyonyo,

Ancient wars: Lee ụfọdụ agha Igbo gbara ike na ya

Ndị Arọ bụ dike n'ịlụ ọgụ n'oge gboo.

Ha na ndị mba Briten chịpụrụ ya na ọgụ ha lụrụ abalị anọ bụ nke a maara dịka 'Anglo-Aro war'.

Ndị Briten buru agha ahụ n'ihi na ha na-ahụta ndị Arọ dịka ndị na-awụnyere ha aja na garị na mbọ ha na-agba iweghara ala Igbo bụ ebe ndị Aro ji ọgbọ dịka ndị 'na-ahụ ụzọ.'

3. gba ohu

Ndị ohu

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Arọ bụ ndị a mara ama n'ịgba ohu mgbe gboo.

E kpee mmadụ n'Ibini ụkpabi, ikpe ma onye ahụ, ọnwụ bụ ihe so ya .

Mana oge e bidoro ahịa ohu, ndị Arochukwu na-ere onye ikpe mara resị ndị ọcha kama igbu ya egbu.

Akụkọ mgbe gboo kọrọ maka otu oke mmadụ aha ya bụ Omenụkọ onye ji ịgba ohu baa oke ọgaranya.

4. Ihibe arụsị

Ndị Arọ na-eme ihe omenala

Ọ bụghị naanị na ndị Arochukwu nwere Ibini-Ukpabi, ha na-aga enyere obodo ndị ọzọ aka ihibe arụsị n'obodo ha.

5. Arondiuzogu, Ajali, Ohafia na ndị ọzọ ha na ndị Arọchukwu bụ nwanne

Ndị mmanwụ

E wezuga omenala, ihe ọzọ e jiri mara ndị Arochukwu bụ azụmahịa na ime njem. Ha bụ ojere mba ka mba.

Ndị Arochukwu bụ ndị na-agba mbọ ma na-eme njem azụmahịa gaa obodo dị iche iche n'ala Igbo na mba ndị ọzọ.

Aha onyonyo,

Lee emume iri ji ndị Arochukwu

Ọtụtụ mgbe, ha gaa mba ọzọ, ha nọrọ ebe ahụ were ebe ahụ mere be, lụọ nwaanyị ma mụbaa.

Ugbua, e nwere ndị Arọ n' Arondizuọgụ, Ajali (Anambra Steeti), Uzuakoli (Abia), Arọngwa ( Abia steeti), Afikpo(Ebonyi steeti) wdg.

Ọtụtụ ụmụnne ndị Arọchukwu na-ezụkọ n'igwe kwa afọ maka 'Mass return' na emume Ikeji.

6. Ndị Ar nwere mmadụ

N'ezie, Arọchukwu so na 'ndị nwe obodo enwe' ma ọ bụrụ otiegwu a ma ama bụ Oliver de Coque.

Ndị Arochukwu nwere ndị aha ha na-ada ụda n'Igbo nakwa n'akụkụ ụwa niile.

Ha gụnyere Alvan Ikokwu(laalara mụọ) bụ onye nkuzi nwere agba, Ọkammụta James Ijoma, Nwakanma Okoro, Alex Onyeado, Alex Otti wdg.

7. Igbu ejima

Aha onyonyo,

Ị ma ihe ịba egwu Ikperikpe ọgụ ndị Ohafia na-erị?

N'oge gboo, ndị Arọchukwu na-atụba ụmụ ejima na nne mụrụ ha n'ajọ ọhịa n'ihi nkwenye na ejima na-ebute ihu ọjọọ.

Mana Linus Nwagba kọwara na "Mary Slessor na-atụtụta ụmụaka ndị ahụ na-elekọta ha".

"Ọbịbịa ụka Kraist mere ka ndị Arọ kwụsị ya bụ omenala nke mere na ugbua ejima juru n'ọtụtụ ezinaụlọ."

Aha onyonyo,

Traditional Retirement:'Ịgba Ọtaọmụ bụ ihe anyị emepe obodo' - Ndị Amaekpu Ohafia

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

Ọgba mbọ: E ji m asambodo mahadum m mana a na ma-azụ ezi'