Coronavirus Lockdown: 'Ụmụnwaanyị atagbuola onwe ha n'ahụhụ n'ihi mkpọchị obodo'

Coronavirus Lockdown: 'Ụmụnwaanyị atagbuola onwe ha n'ahụhụ n'ihi mkpọchị obodo'

Kamgbe gọọmentị machiri mkpagharị ndị mmadụ n'ihi ọrịa coronavirus, ọtụtụ na-ebe akwa arịrị na ahụhụ akarịala.

Ọtụtụ ndị ka na-agakwa ahịa ire ihe n'ihi na ha kwuru na agụụ ga-egbu ha ma ha nọrọ n'ụlọ.

Mgbe BBC gara n'ahịa dị icheiche ịmata etu ihe si aga, otu nwaanyị gburu ikpere n'ala rịọ onyeisiala Buhari ka ọ hapụ ndị mmadụ, ọ kachasị ndị na-ere ihe nri ka ha rewe ahịa ha.

Nwaanyị a kwuru na ọ bụ ụmụnwaanyị kacha ata ahụhụ n'ihi mkpọchi obodo.

Gere ihe ha kwuru.