Coronavirus Tips: Igwe ahụ ọkụ ọ na-egosi onye nwere ọrịa coronavirus?
Coronavirus Tips: Igwe ahụ ọkụ ọ na-egosi onye nwere ọrịa coronavirus?
Otu n'ime njirimara ọrịa coronavirus bụ ahụọkụ.
Nke a mere na tupu mmadụ abanye ebe ọbụla ugbua, a ga-eji igwe nke Bekee kpọrọ 'thermal scanner' wee mara ma ahụ onye ahụ ọ dị ọkụ karịa etu o kwesịrị ịdị.
Mana ọbụghị igwe ahụ ga-ekwu ma onye ahụ enwere ọrịa coronavirus ma o nweghi.
Cheta na ha dị ọtụtụ ọrịa nwere ike ime ka ahụ mmadụ dị ọkụ karịa etu o si adịbu.
Ọzọkwa bụ na mmadụ nwere ike inwe nje coronavirus mana ahụ ya adịbeghị ọkụ, nke pụtara na onye ahụ nwere ike ibufe ndị ọzọ ya bụ ọrịa.