Zambia Dad: Ụzọ isii ndị nne na nna si ata ụmụ ha ahụhụ n'oge gboo

Nwata apíara ụtarị

Ebe foto si, Getty Images

Kemgbe akụkọ nna danyere na nsogbu ndi uweojii maka iti nwa ya dara ule ihe gbara n'intanet, ọ kpalitela ndọrịtaụka n'etiti ụmụ Naijiria.

Ndị uweojii mba Zambia kpọrọ George Bester oku dịka ihe onyonyo wuru ewu na soshal midia gosiri ebe ọ mara nwa ya ụra maka emeghị ọfụma n'ule n'ụlọakwụkwọ dị na Lusaka, mba Zambia.

Ihe so gbakaa nwoke a isi bu nnukwu ego karịrị dọla iri abụọ na ụma ọ na-akwụrụ nwa ya n'ụgwọ akwụkwọ, nwa ya nwoke eleghị ule Mathematics na English, ebe ọ dara CRK, mana o mere nke ọma na Music.

Ọtụtụ ụmụ Naijiria na-ekwu na o nweghị ihe ọjọọ dị na ihe Bester mere nwa ya, kama ọ bụ ịgbaziri ya ụzọ.

Ụfọdụ kwuru na ndị mụrụ ha etiela ha ihe maọbụ nye ha ntaramahụhụ karia nke Bester tiri nwa ya maka ihe erughị nke nwa Bester mere.

Lee ụzọ ụfọdụ ndị nne na nna aka ochie Igbo si adọ ụmụ ha ma ha dajọọ:

1. Okwu na-afụ ka ose

Alex Chiejina bụ onye a zụrụ na nkuzi ụka Katọlik kwuru na nna ya anaghị apịakarị ya ịtarị ma ya mejọọ kama "nna m na-agwa m okwu na-emetụ n'ọkpụkpụ."

Ebe foto si, Alexander Chiejina

2. Ilu na akụkọ nwere nkuzi

Emeka Ibemere, onye nwerela ezinaụlọ kwuru na "nna m na-eji ilu apịa m ụtalị ma m mee ihe ọjọọ."

3. Ịpịa ụtalị

Simon Nwabueze kọwara sị: "Oge m dị na nwata, m mejọọ, nne m na-apịa m ihe. Mgbe ụfọdụ ọ na-akpọlite m n'ụra n'etiti abalị gwa m okwu."

N'otu aka ahụ, nwaada Igbo kpọrọ onwe ya Amaka Azunnaya sịrị na "nna m na nne m na-apịa m utarị, ma m mee ihe na adighi mma".

Ebe foto si, Getty Images

4. Ichu ụra

Ikechukwu si na ya abụghị onye ji isi ike too mana ya nyụọ nsị n'ụlọụka gbaa ọsọ, "ndị mụrụ m na-eche ka m laba ụra, were ụtalị pịalie m".

Ọ hịara ahụ ịhụ ndị a mụrụ n'afọ 70s, 80s na 90s ndị mụrụ ha apịaghị ụtalị ọ bụladị otu ugboro.

5. Ịwọ nri

Otu nwaanyị a chọghị ka a kpọọ aha nyere ọmụmaatụ a:

"Diọkpara m dị afọ iri na anọ richara nri dọwa efere n'ụlọekwu asaghị ya asa."

"A gwara m ya ka ọ gaa saa ya mana ile ihe onyonyo ka ya mkpa."

"M wee sie osikapa jọlọf tọpuru isi kenye nna ya nke ya, rie nke m, tọgbọ ite."

6. Isekpu ala,chilie aka elu

Ọ bụghị naanị ndị ochie, ụfọdụ ndị nkụzi nọ n'ụlọakwụkwọ gọọmenti ka na-agbaso ụzọ a iji kụziere ụmụaka ihe ma ha dahie.

O nwere ihe dị iche n'etiti mgbazi na mmegbu

Kedụ ihe dị iche n'etiti mgbazi na mmegbu?

Ụfọdụ ntaramahụhụ ndị nne na nna nyere ụmụ ha n'oge gboo bụ nke ụfọdụ nwere ike ịkpọ 'child abuse' n'oge ugbua.

Onye ọkaiwu mabụrụkwa onye na-agba mbọ maka ikike dịrị ụmụaka bụ Dorothy Oleka kwuru na ihe di iche na ịgbaziri nwata ma o mejọọ na imegbu nwata bụ ka ụdị ntaramahụhụ i nyere ha.

Ebe foto si, Dorothy Oleka

Oleka, onye ndu Nwanyibu-Ife Development & Resource Foundation, kwukwara sị, "Iwu ekwughị ka ọ ga-aha ọ bụrụ mmegbụ mana inye nwata ntaramahụhụ merụrụ ya ezi ahụ, imegbuola nwa ahụ."

"I nwere ike ịsị nwata sekpuru ala n'ime ụlọ mana ị sị ya sekpuru ala n'elu okwute maọbụ n'anwụ maọbụ sekpuo ala awa anọ, ọ ghọọla mmegbu."

Akụkọa ga-amasị gị