Igbo Celebrities: Yul Edochie, Ụmụ Obiligbo... Lee ụmụ Igbo a ma ama na-eso nzọụkwụ nne maọbụ nna ha

Yul Edochie, Destiny Etiko, Umu Obiligbo

Ebe foto si, Instagram

Nkọwa foto,

Yul Edochie, Destiny Etiko, Umu Obiligbo

Igbo na-atụ ilu sị na "ihe agwọ mụrụ aghaghị ito ogologo", maka na nne ewu na-ata ahịhịa, nwa ya a na-ele ya anya ọnụ.

Nke a pụtara na mkpụrụ nne na nna kụrụ ka ụmụ ha ga-ejide aka were na-eto.

Ha dị ọtụtụ ụmụ Igbo a ma ama nke Bekee kpọrọ 'celebrities', ndị nne ha maobụ nna ha bụkwa ndị a ma ama n'oge nke ha.

Ụfọdụ bụ ndị na-eme ejije onyoonyoo, ụfọdụ na-eti egwu, ebe ndị ozọ abụghị ihe nne na nna ha mere ka ha na-eme, mana ha bụkwa ndị a ma ama dịka nne na nna ha.

Yul Edochie na Pete Edochie

Ebe foto si, Instagram

Nkọwa foto,

Pete Edochie na nwa ya bụ Yul Edochie

A chọwa ụmụ Igbo ma ihe ha na-eme n'ejije Nollywood, aha Yul Edochie ga-abatarịrị ya.

Nna ya bụ Pete Edochie bụkwa nnukwu mmadụ na Nollywood.

Aha onyonyo,

'Ọ bụ "Feminism" na-ebute ihe di ji eti nwaanyị ihe n'ụlọ' - Pete Edochie

Yul kọwara na onweghị mgbe nna ya ji kpọrọ ya n'aka kpọbanye ya Nollywood, kama ọ chọpụtara na ọ bụ akaraka Chineke nyere ya o ji pụta ụwa.

Mana iji gosi na ọ ga-eme karịa nna ya, Yul Edochie banyekwara ndọrọndọrọ ọchịchị.

O so zọọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti na ntuliaka gara aga, ma na-ekwukwa na ya ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023.

Nna ya bụ Pete Edochie emeghị ihe ndọrọndọrọ ọchịchị chaachaa.

Pete Edochie nwekwara nwa ọzọ aha ya bụ Linc Edochie, onye metụrụ ejije ntakịrị tupu o kwụsị.

Mana akụkọ kwuru na ọ ka nọkwa na Nollywood, mana ọ naghị apụtakarịzi n'onyonyo.

Destiny Etiko na Eucharia Etiko

Ebe foto si, Destiny Etiko/Instagram

Nkọwa foto,

Destiny Etiko

Ọbụghị ọtụtụ mmadụ ma na nne Destiny Etiko bụ Eucharia Etiko mere ihe ejije n'oge nke ya.

Eucharia so na ndị a ma ama n'ime ihe ejije n'agbata 1990 dịrị gawa, dịka otu onye ma ya nke ọma si kwuo.

O so n'ejije a kpọrọ "Bless my Soul", "Royal Reward", na ejije TV a kpọrọ 'Change and Smile' nke wuru ewu n'oge ahụ.

Taa, nwa ya nwaanyị bụ Destiny Etiko so na ndị aha ha na-adụ ụda na Nollywood.

Ejije Destiny Etiko sonyerela na ya karịrị ngụta ọnụ.

Akunwafor Obiligbo na Ụmụ Obiligbo

Ebe foto si, Youtube/Instagram

Nkọwa foto,

Akunwafor Obiligbo na Ụmụ Obiligbo

Akunwafor Obiligbo bụ onye tiri egwu ekpili n'oge gboo.

Ọ bụ ya mụrụ Akunwafor na Okpu ọzọ Obiligbo, ndị otiegwu e ji Ụmụ Obiligbo wee mara.

Ụmụ Obiligbo malitere iti egwu ekpili, ụdị nke nna ha tiri, mana ugbua, ha na-etizi egwu ọgbara ọhụrụ.

A marala Ụmụ Obiligbo ama gafee obodo Naịjirịa, karịa etu e si mara nna ha n'oge gboo.

Clarion Chukwurah na Clarence Peters

Ebe foto si, Instagram/Clarenceshotit/Clarence Chukwurah

Nkọwa foto,

Clarence Chukwurah na nwa ya nwoke bụ Clarence Peters

Clarence Peters bụ onye a ma ama na-emepụta onyonyo egwu (music videos).

Nne ya bụ Clarence Chukwurah, onye a makwa ama n'ime ejije.

Nna ya bụ Shina Peters, oti egwu aha ya na-ada ụda na Naịjirịa.

Ray Emodi na Joy Emodi

Ebe foto si, Ray Emodi/Instagram

Nkọwa foto,

Ray Emodi na nne ya bú Joy Emodi

Ray Emodi bụ aha a ma ama na Nollywood, nne ya bụ Joy Emodi bụkwa onye a ma ama.

Mana ihe e ji mara Joy Emodi bụ ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụghị ejije Nollywood.

Joy Emodi nọchiri anya Anambra North na ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa malite na 2005 ruo 2010.

Uche Chukwumerije na Dike Chukwumerije

Ebe foto si, Getty Images/Dike Chukwumerije

Nkọwa foto,

Uche Chukwumerije (n'etiti) na ụmụ ya Chika (aka ekpe) na Dike (aka nri)

Nna na nwa a bụcha ndị a ma ama, mana ihe e ji mara ha abụghị otu ụdị ihe.

Uche Chukwumerije bụ onye omeiwu nọchitere anya Abia North malite na 2003 ruo 2015, ebe nwa ya bụ Dike bụ onye ode akwụkwọ nakwa ode abụ ama ama.

Otu abụ wuru ewu nke si n'aka Dike Chukwumerije bụ nke oge o dere oge odogwu Chinua Achebe lara mmụọ, iji sị ya jee nke ọma.

N'aka nke ọzọ, nna ya bụ Uche Chukwumerije, so ndị omeiwu gbara mgba ka onyeisiala Naịjirịa n'oge ahụ bụ Olusegun Obasanjo, ghara ịchị ọchị nke ugboro atọ, nke a kpọrọ 'third term agenda' n'afọ 2011.

Uche Chukwumerije nwekwara nwa ọzọ a ma ama n'egwuregwu Taekwondo, aha ya bụ Chika Chukwumerije.

O ritere ọla nchara n'asọmpi Olympics nke afọ 2008 e mere na Beijing, China.

Kema Chikwe na Naetochukwu Chikwe (Naeto C)

Ebe foto si, Naetosuperc/Instagram

Nkọwa foto,

Naeto C na nne ya Kema Chikwe

Naeto C bụ otiegwu a ma ama, ọ kachasị na mmalite afọ 2000 ga.

Nne ya, Kema Chikwe, bụkwa onye a ma ama na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa.

Charles Soludo na Ozonna Soludo

Ebe foto si, Nstagram/Charles Soludo

Nkọwa foto,

Chukwuma Soludo na nwa ya Ozonna

Charles Soludo bubu onyeisi ụlọakụ etiti bụ 'Central Bank', mana nwa ya, Ozonna, bụ onye a ma ama n'iti egwu.

Ozonna bi na mba UK ebe ọ nọ eti egwu nke ya, mana aha ya anachaghị ewu ewu na Naịjirịa nke ukwuu.

Kedụ ndị ọzọ ama ama ị ma nne na nna ha bụkwa ndị a ma ama?