Rochas Okorocha: Ọkaiwu Nzeribe akpọpụtala 'ungun Judicial known man'

Ebe foto si, Rochas Media team
Onye bụbu Gọvanọ Imo steeti na sinatọ na-anọchite anya ndị Imo West bụ Rochas Okorocha ekwuola na ya bụ ikpe ụlọikpe ukwu nke Imo steeti kpebiri maka ụlọ na ala ya bụ "ikpe mara eziokwu".
N'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Sam Onwuemeodo tinyere aka, Rochas sị na ya bụ ikpe akwụghị ọtọ maka na ikpe a Ọkaiwu Njamanze kpebiri taa bụ ikpe ka dịcha n'ụlọikpe ndị ọzọ.
Ọ na-akọwa na ya bụ ọkaiwu ekwesighị inye gọọmenti Imo steeti ikike ka ọ napụ ya ngwongwo ya ebe ikpe a ka dị n'ụlọikpe ndị ọzọ.
Ọ sị na 'Njamanze fọrọ otu ụbọchị ka ọ laa ezumike nke mgbe o ji gbanụgbanụ kpebie ya bụ ikpe'.
Okorocha kwuru na Ọkaiwu Fred Njamanze nyeburu gọomentị Imo steeti iwu ịnapụ ya ngwongwo ya kemgbe 24 Febụwarị 2021, mana ọgbagwojuziri ha anya ka ụlọikpe ahụ ji kweziri ka ya napụ ya ngwongwo ndị ahụ.
Ọ sị na ya bụ ikpe gosiri na ọkaiwu Fred Njamanze kpọpụtara ihe ọkpọrọ "ungun Judicial known man" na Bekee, nke pụtara na ya bụ ikpe gbagwojuru anya.
'Anyị enwetebeghị akwụkwọ ọbụla maka ụlọ Rochas a sị na-anapụrụ ya' -Onye enyemaka Rochas
Onye enyemaka Rochas Okorocha na soshal midia bụ Ebere Nzewuju ekwuola na ha enwetebeghị akwụkwọ ọbụla n'ụlọikpe maka ya bụ ụlọ Rochas Okorocha asị na ụlọikpe ukwu dị n'Owerri Imo steeti napụrụ ya.
Nzewuju sị na ọnweghị ihe ọbụla ya ga-ekwu rụọ mgbe ha nwetere akwụkwọ sitere ụlọikpe ahụ.
Kọmishọna mgbasa ozi Imo steeti bụ Declan Emelumba kwuru na ya bụ nnapụ e kwuru na ụlọikpe napụrụ ụlọ ndị ahụ bụ eziokwu.
Emelumba sị na 'obi dị anyị mma na ụlọikpe enyela anyị ikike ịweghara akụnaụba ndị ahụ'.
Ọ sị na mbụ, na Okorocha sị na Imo steeti enweghị ikike ịweghara ala na ụlọ Okorocha naara ndi Imo.
Nke a mere ha jiri gawa ụlọikpe ị ga jụọ ụlọikpe ma ha nwere ya bụ ikike n'ezie.
'Ugbua ụlọikpe kwuru ya, anyị ga-aga n'ihu napụchaa ya ụlọ na ala niile ndị Imo steeti o ji'.
Channels TV depụtara ụlọ na ala asaa ha sị na ụlọikpe ukwu napụrụ Rochas.
Ha gụnyere;
- Eastern Palm University
- Royal Spring Palm Hotels and Apartments
- IBC staff quaters ebe ọ rụrụ Rochas Foundation College
- Owerri magistrate quarters
- Plot B/2 Otammiri South Extension Layout
- Plot P5, Naze residential layout nke a sị na Nkechi Okorocha nwe
- ỤỊlọ ndị ọzọ dị na akwụkwọ ọcha gọọmentị dere ndị 'ime obosara akwụkwọ 226 - 272 na ndị ọzọ.