Wolves FC vs Manchester United: Ọ fọrọ obere ka nkịta ọhịa tagbuo ManUnited

Wolves FC na Manchester United

Ebe foto si, Getty Images

Chi ndị Manchester United mu anya dịka ha ji otu ọkpụ goolu esitere n'ọnwụ were merie ndị otu Wolves n'ụlọ ha.

Dịka ya bụ asọmpị na-ebido, ndị Wolves gbara shọtụ anọ nke atọ n'ime ha rutere postu ndị ManUnited n'ime nkeji iri na ise asọmpị a bidoro.

Ebe foto si, Getty Images

Na nkeji iri ise na atọ ka ndị ManUnited wepụrụ Dan James were webata Edinson Cavani.

Nke a na-eme ya asọmpị premier League mbụ Cavani na-agbara ndị Manunited.

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe Romain Saiss ji bọọlụ nọrọ n'ihu postu ndị Manunited were gbapụ shọtụ dị ọkụ, ụfọdụ chere na ha enyela goolu kama De Gea ekweghị.

Dịka De Gea tipụtara shọtụ Saiss, Saiss siri ọnwụ gbakwa kwa shọtụ ọzọ mana De Gea kwechiri were tipụta shọtụ ya ọzọ kwa.

Ebe foto si, Getty Images

Na nkeji iri asaa na abụọ, ndị Wolves wepụrụ Daniel Podence were tinye Trincao, ebe ndị ManUnited wepụrụ Jadon Sancho were tinye Anthony Martial.

Dịka a na-eche na otu abụọ a ga-agba onwe ha onye lawa onye lawa, ka Mason Greenwood nyere goolu na nkeji iri asatọ na anọ.

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụ na nkeji iri itolu na ise ka ogbu opi gbuchiri asọmpị a.

Liverpool na Chelsea adọọla ka ofe ọkwụrụ bọrọ chi

Ebe foto si, Getty Images

Liverpool na Chelsea zutere onwe ha na Premier League taa, kama onye-lawa onye-lawa ha gbara onwe ha ejughị ụfọdị ndị afọ.

Dịka ya bụ asọmpị bidoro, ndị Chelsea nọ n'ofe dịka ha ji otu goolu emerị ndị Liverpool.

Ọ bụ na nkeji iri abụọ na otu ka Kai Havertz ji isi mepee neti ndị otu Liverpool.

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụ dịka Reece James ji aka ya metụ bọọlụ n'etiti agba penariti ndị Chelsea ritere Liverpool Penariti.

Ebe foto si, Getty Images

Mo'Salah egbughị oge iji ya bụ penariti ritere ndị otu Liverpool goolu ha.

Ebe foto si, Getty Images

Nke a mere ka Chelsea wụlaa azụ dịka ndị Liverpool ji ohere a chụsịwa goolu ọzọ ike.

Mbọ niile otu abụọ a gbara, ọkachasị ndị Liverpool ịnye goolu ọzọ amịtaghị mkpụrụ ọbụla.

Manchester City vs Arsenal: A nyakasịala Arsenal ka gwongworo bu aja arị ugwu

Ebe foto si, Getty Images

Ihe mgbu Arsenal ka na-aba ọnya dịka Man City wụnyere ha ose n'ahụ ha merụrụ.

Goolu ise asataghi otu (5 - 0) ha nyere zuru iji kpochie ili Arsenal, bụ ndị na-atụtabeghi pọịntị ọbụla kemgbe afọ bọọlụ ọhụrụ a bidoro.

Site na nkeji asaa IIkay Gundogan ji dọkaa neetị nke mbụ, Arsenal ekurughi mmiri tọgbọ iko ruo mgbe e gburu opi mgbuchi.

Ebe foto si, Getty Images

Feran Torres mezuru ya abụọ na nkeji 12 e ji bido bọọlụ, na-echeghi echiche maka Arsenal bụ ọbịa ha nabatara n'ụlọ.

Ka o ruru nkeji 35, a chụpụrụ Granit Xhaka maka ịwụ Joao Cancelo ụkwụ.

Ebe foto si, Getty Images

Gabriel Jesus gbawatọpụrụ ndị Arsenal obi mgbe ọ gbakanyere goolu nke atọ na nkeji 43.

Ka a banyere agba nke abụọ, Rodri malitekwara mkparị Arsenal ọzọ site n'inye goolu nke anọ na nkeji 53.

Ebe foto si, Getty Images

Ferran Torres mezuru ya ise na nkeji 84, iji kpọnye ntụ n'akpati Arsenal. Nke a bụkwa goolu nke abụọ o nyere n'egwuregwu a.

Ebe foto si, Getty Images

Ntule tupu agbaa asọmpi Mancity na Arsenal FC

Echi ga-adị kpọọkpọọ dịka Manchester City ga-emere Arsenal ọbịa n'asọmpị Premier League n'ụbọchị satọde.

Ọtụtụ ndị mmadụ kpụ Arsenal n'ọnụ dịka emerie ha echi, ihe ọpụtara bụ na ọ ga-abụ ụgboro atọ a na-emeri ha n'usoro n'asọmpị Premier League ọhụrụ a.

Ọ ga-egosikwa na nke a ga-eme ya mbụ Arsenal eriteghị akara ọbụla kamgbe asọmpị Premier League nke afọ 1954-55.

Ọzọkwa bụ na-emerie ha, nke a ga-eme ya ugboro itolu ManCity na-emerị ha n'usoro.

Ihe ị kwesịrị ịma maka asọmpị echi a

Nke mbụ bụ na Kevin de Bruyne agaghị eso na ya bụ asọmpi.

Bukayo Saka ga-eso gbara Arsenal na-agbanyeghị na ọ merụrụ ahụ na mmerị ha meriri West Brom.

Hector Bellerin onye merụrụ ahụ n'ụkwụ ya enwetela onwe ya.

Ebe Alex Runarsson na Willian ga-agba asọmpị a dịka

Ihe dị mkpa

  • Emeribeghị Manchester City ugboro ịrị na otu ha zutere Arsenal .
  • Ọ bụ naanị otu goolu ka Arsenal nyerela n'ugboro asaa ha zutere Manchester City nsonso.
  • Raheem Sterling enyelsa gollu ugboro anọ Mancity zutere Arsenal nsonso a.
  • Arsenal enyebeghị goolu ọbụla kamgbe asọmpi premier league afọ a.