Yunaited Neshọn ebidola atụmatụ inyere mmadụ aka na Naijiria

Ndị gbara ọsọ ndụ n'ugwu Naijiria Image copyright Getty Images

Ụlọọrụ ndị Yunaited Neshọn na-ahụ maka inyere mmadụ nọ n'Abuja,a isi obodo Naijiria a rịọla ka a tụkọta ihe karịrị otu ijeri dọla maka inyere ndị kwuru nde mmadụ na mpaghara ebe e nwere ọgbaghara na-akụkụ ọdọmmiri Chad.

Onye ntaakụkọ BBC nọ n'Abuja bụ Is'haq Khalid kwuru n'ulọọrụ otu Yunaited Neshọn na-ahụ maka inyere mmadụ aka kwuru na nsọgbụ ọnọdụ ndị mmadụ nọ ugwu Naijiria, ebe ihe ruru puku mmadụ asatọ nọ n'ọnọdụ ọjọọ nke kacha njọ n'ụwa niile n'afọ 2018.

Nsogbu agha ọlụọla, Boko Haram, ebutela mmebi ewumewu na ihe ndị ọzọ eji enyere ndụ aka ma mekwa ka ọtụtụ gba ọsọ ndụ gbapụ n'obodo ha.

Ụlọọrụ ndị Yunaited Neshọn kwuru na nsọgbụ agụụ na ụkọ nri na-enye ndị a nsọgbu dị oke egwu.

N'atụmatụ enyemaka a nke bidoro taa (8/2/2018), a ga-enye ndị ọdị oke mkpa ihe ndị eji azọ ndụ.

Ụlọọrụ Yunaited Neshọn kwuru na ọ bụ ha na gọọmenti Naijiria na ndị ọzọ na-ejikọ aka mee nke a.