Sineti: Bịa kọwaara anyị ihe butere mwakpo ndị agha Kamerun

Mapụ Kamerun

Ndị bi na mpaghara Krọs Riva ebeela akwa maka ihe karịrị nde mmadụ abụọ ndị Kamerun na-enubata n'obodo ndị nọ n'agbataobi Naijiria na Kamerun, ebe akụkọ kwuru na ndị agha wakporo ndị Krọs Riva.

Onyeisi Kọmishọn na-ahụ maka obodo ndị nọ n'agbataobi Naijirịa na Kamerun akpọrọ State Border Communities Commission na bekee bụ Ambasadọ Ayang Azom Ayang gwara onye ntaakụkọ BBC na "Anyị nwere nde mmadụ abụọ ndị si Kamerun gbata ọsọndụ n'obodo ndị bụ agbataobi anyị na ndị Kamerụn. Obodo dịka Ikọm, Ugep d.g.z.

"Ọnọdụ dị n'ebe ndị a dị oke ọjọọ. Ezinaụlọ ọbụla na ebe ndịa nwere mmadụ ruru mmadụ iri ise maọbụ iri isii ndị gbara ọsọndụ ha labatara."

O kwuru na nke a butere ụkọ ihe eji e nyere ndụ aka dịka mmiri, nri na ụlọmposi.

O kwukwara na "Izu abụọ garaaga ndị agha Kamerun wakporo obodo ndị dị na agbata Najiria na Kamerun."

Ayang kwetara na n'ezie, ndị agha Kamerun wakporo ndị bi n'mpaghara ahụ.

Sineti kpọrọ Minista nchekwa ọkụ

Ụnyaahụ, Sineti kpọrọ Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Mansur Dan Ali, ka ọ bia kọwa ihe mere ndị agha Kamerun na ndị obodo ahụ gbara ọsọndụ ji enubata n'ala Naijiria n'enweghị nsogbu ọbụla.

Ụlọomeiwu ukwu kwuru na nnubata ndị si Kamerun gbaa ọsọndụ gbaga n'obodo Krọs Riva na ndị ọzọ dị n'agbataobi Najirịa na Kamerun nwere ike ibute nsogbu nchekwa.

Ha kwukwara na nsogbu a nwekwara ike ime ka ịgba akwụna na mwakponike rịa elu.

Sineti kwuru ka ndị agha Naijirịa zipu ndị otu ha ebe ahụ iji mee ka nchekwa sie ike na mpaghara ahụ.

Otu onye bi n'Ikọm dị na Krọs Riva nke achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC na "ọtụtụ ndị ji ụgbọala ugegbe ya jiri eji nke bu akara mba Kamerun na-enubata.

"Anyị amaghị ma ndị nọ n'ime ha a bụ ndị agha Kamerun ka ha a bụ ndị uweojii."