Buharị ọ ga-eteta n'ụra ugbua?

Kaigama, Buhari, Adewale Martins Image copyright @NGRPresident
Nkenke aha onyonyo Ndị bishop chọrọ ka Buhari leba anya n'ọgbaghara ndị ọchị ehi na ndị ugbo

Ọchịchị onyeisiala bụ Muhammadu Buharị ọ ga-eteta n'ụra za akwa arịrị ọtụtụ ndị Naijiria na-akwa maka oke ihe isi ike, enweghị ọrụ, agụụ na oke ogbugbu mmadụ na-arị elu bụ ajụjụ nọzi n'ọnụ ọtụtụ ndị mmadụ, ọkachasị ndị ọnụ na-eru n'okwu.

Ụnyaahụ ndị Bishọp ụka Katọlik na Naijirịa tinyere olu ha n'okwu ndị katọrọlarị ọchịchị Buhari sị na ọ kụọla afọ n'ala n'imejupụta atụmanya ndị ọha Naijirịa kemgbe o jiri rigoro n'ọchịchị afọ atọ gara aga.

N'ọnwa Mee afọ 2015, mgbe o rigoro ọchịchị, Buhari kwere ndị Naijirịa nkwa atọ; ọrụ, nchekwa na ibu agha megide mmerụaka. N'ime nkwa ndị a, Buharị enweela ihe ndị o mere:

  • Obodo Boko Haram ji enwerela onwe ha

O zigara ndị agha n'ugwu Naijirịa ebe ndị agha Boko Haram na-akpa ike.

Ha gbara mbọ ibelata nsogbu ha site na inapụta obodo ndị Boko Haram werela nye onwe ha, ma gbapụta ọtụtụ ndị ha tọọrọ.

A gbapụtara ọtụtụ ụmụnwaanyị na ụmụaka ndị Boko Haram tọọrọ gụnyere ndị nke Chibok.

  • EFCC nwụchịrị ndị eboro ebubo mpụ na mmerụaka

Buhari bidokwara agha megide mpụ na mmerụaka dịka otu EFCC jidekwara ọtụtụ ndị eboro ebubo mmerụaka dịka Sambo Dasuki, Olisa Metuh na Femi Fani-Kayode dgz.

Mana ka ihe ndị a na-aga, akụnaụba NaijirIa kụrụ afọ n'ala.

Nsogbu ọchịchị ya wetara

Ihe isi ike jidere ọtụtụ dịka Riseshọn bidoro.

Ka ihe si aga, kama iweta ọrụ, ọtụtụ ghọrọ ndị enweghịzi ọrụ. Dịka NBS siri kwuo, mmadụ karịrị nde asaa bụ ihe achụrụ n'ọrụ kemgbe ọ banyere ọchịchị.

Ọtụtụ ụlọọrụ mechiri, ebe izu ohi, ntọ, na mpụ dị icheiche bawanyere.

Ọtụtụ ndị otu ọchịchị ya eboro ebubo mmerụka na-agagharị n'enweghị onye ọbula ji ha, nke mere ka ụfọdụ sị n'ọgụ megide mmerụka ọchịchị ya na'alụ bụ ọgụ megide ndị otu pati ndị n'anọghị n'ọchịchị.

Ndị ọchịchị Buhari e boro ebubo mmerụaka

  • Abdulrasheed Maina - N100 billion ego penshọn
  • Usman Yusuf - N191 million ego NHIS
  • Babachir Lawal - N2.5 billion ego IDPs
  • Danbazzau - $1.5m

Izuụka gara aga, onye bụbu onyeisiala Naijirịa bụ Ibrahim Babangida katọrọ Buhari maka etu o si n'eso ogbugbu mmadụ na mmebi akụnauba nke ndị Fulani na-achị ehi.

Onye chịburu Naijiria bụ Olusegun Obasanjo katọkwara Buhari maka ịkpa oke ma kwuo ka ọ ghara ịzọ ọchịchị n'afọ 2019 n'ihi ihe ọ kpọrọ amaghị achị nke butere nsogbu enweghị nchekwa, agụụ na enweghị ọrụ.

Okwu ọkachamara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị

Ndị ọkachamara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwu n'okwu ndị bishọp ndị ụka Katọlik kwuru banyere ka ihe si aga n'obodo n'ọchịchị Buhari bụ ebumnobi ndị ọha Naijirịa.

Na mkparitaụka ya na onye ntaakụkọ BBC, osote onyeisi otu ndị ọkaiwu Naijiria a na-akpọ NBA n'aha ichafụ bụ Monday Ubani kwuru sị:

"Ihe niile ha (ndị Katọlịk bishọp) kwuru bụ eziokwu. Buharị emegharịghị ahụ dịka o mere oge anyị nwere nsogbu IPOB, oge anyi nwere nsogbu Naija-Delta. A gara ebe ndị a ga gbaa egwu.

Orue ugbua ndị Fulani na-achị ehi na-egbusisi mmadụ ebe dị icheiche, o nweghị ndị ezigara ịga gbaa egwu wee kwụsi ihe na-eme."

Ubani kwukwara na dịka ndị Bishọp kwuru, n'ihe gbasara inye ọkwa na onyeisiala emeghị dịka o kwesịrị.

Gbenga Oni Daniel, onye ọzo bụkwa ọkachamara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị kwuru n'ezie na Buhari na-akpa oke.

"Ọ bụrụ na a machiri IPOB, amaghị m ihe mere eji ahapụ ndị Fulani ji egbe ka ha n'agagharị."

"A gaghị enwezi nsogbu nchekwa ma ọ bụrụ na gọọmenti etiti akwụnyeghịrị onye ọbụla dịka ha si eme ugbua."

Mana otu onye ugwu bụ Abba Kyari kwuru na ndị na-ekwugide Buharị ejighị eziokwu aga n'ihi na ha ekwughị otu ahụ mgbe Boko Haram na-akpa ike n'oge ọchịchị gara aga.

N'oge garaaga, ka ọtụtụ ndị mmadụ na-eme mkpesa maka ihe isiike na-ala adịghịmma n'obodo, ndị gọọmentị etiti hụtara ya ka okwu ndị na-anọghị n'ọchịchị na-akpalite.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ihe ndị Bishop ụka Katolik kwụrụ na Twita: