Boko Haram ji zi ụmụagbọghọ awakpo ndị mmadụ
Boko Haram ji zi ụmụagbọghọ awakpo ndị mmadụ
Ọnụ ọgụgụ ụmụagbọghọ ndị Boko Haram na-atọrọ na-arịzị elu ugbu a.
Ha na-akwado ụmụagbọghọ ndị a maka ịlụ ndị agha ha, ma ọ bụ eyinye ha uwe ogbunigwe ka ha baa n'ime ụlọụka, ụlọalakụba na ụlọahịa dị n'obodo dị icheiche ga gbagbuo ndị mmadụ.
Nke a bụ akụkọ Falmta bụ otu n'ime ndị atọrọ n'afọ 2013.
Ọ kọwara ahụhụ ọ tara n'aka ndị ahụ tupu ọ gbaa ọsọ bụrụ onye nwere onwe ya.