Ecowas kwetere itinye ụtụisi na ngwaahia a na-eme n'ụlọ

Kemi Adeosun bụ m̀inista akụ na uba Nigeria dị na-aka Image copyright @HMKemiAdeosun
Nkenke aha onyonyo Kemi Adeosun bụ onyeisi kọmiti tariff technical committee (TTC) bụ ndị tụpụtara alo a

Gọọmenti etiti Naijiria ekwuola na ha ga ewechita ụtụisi ngwaaghị emere na Nigeria dịka ọtọbiribiri mkpụru osisi bekee kpọrọ fruit juice nakwa recharge card.

Nke a pụtara n'ọnụahia ndị a ga arielu mgbe adịghị anya. Minista okwu ego dị na-aka bụ Kemi Adeosun kwuputara nke a dịka otu n'ime ihe ha kpebiri na ọgbakọ tariff technical committee nke ụlọakụ ukwu bụ Central Bank, ministry nke ugbo nakwa ọrụaka, Federal Inland Revenue Services, ụlọọrụ odeakwụkwọ nke gọment nakwa Manufacturers Association of Nigeria so n'ime ya.

Adeosun kwuru na nke a ga-enyere azụmahia na mba Ecowas aka.

Mana ụfọdụ na-eche na ya bụ alo ga-ebuli ọnụahia e mere na Nigeria, dịka nta akụkọ siri bụ o.

Nkedụ ngwaahia ihe a metụtara?

Ihe ndị so na ngwa ahịa ndị a: pefium,ude, mmanya anaghị egbuegbu, mmanya ọtọbiribiri mkpụrụosisi, ncha, ncha ntụ e ji asụakwa, rịchajị kadị na akwụkwọ firifiri e ji aga mposi.

Adeosu si na nri dịka nụdles na spageti esoghị na ya maka ha bụ nrị ndị mmadụ na-erikebe.

Gọọmenti wepuru ụtụisi na nri kemgbe afọ 2009 ka e were nyere ndị na-arụpụta ngwaahia na Nigeria aka irepụ ngwaahia ha.