Innoson: Enyeghị m akwụkwọ bia ụlọikpe

Innocent Chukwuma Image copyright @InnosonMotors
Nkenke aha onyonyo Innocent Chukwuma

Na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ BBC nwere n'ekwentị, ọnụ n'ekwuchitere Innoson Motors bụ Cornel Osigwe kwuru sị, "Innoson bụ ojiegoachụego a ma ama. Ọ naghị atụ egwu ịza ụlọikpe oku. Ọ bụ na asịrị ka ndị ọkaiwu ya nụrụ ya bụ oku were si ka ha ga mara ma ọ bụ eziokwu."

Jọstis Mojisola Dada nyere iwu ka anwụchie Chukwuma ma kpụta ya n'ụlọikpe ụbọchị anọ nke ọnwa Maach n'ihi na ọ baghị ụlọ ikpe ụbọchị e hiri ikpe ya.

Ndị ọkaiwu Chukwuma rịọrọ ụlọikpe ka ha zigara Chukwuma akwụkwọ oku ahụ, ebe ọkaikpe nyere iwu ka enye ha ya n'ụlọikpe ozigbo.

Ka ọ dị ugbua, Ndị ọkaikpe Innoson Chukwuma a gala ị hụ ịkpesara ụlọikpe nke Appeal ka ọ nyere ha aka mee ka e zitara Chukwuma akwụkwọ oku dịka iwu obodo siri kwụo.

Cheta na ngalaba na-ahụ maka mpụ na mmerụaka akpọrọ EFCC na aha ịchafụ kpụpụrụ Innocent Chukwuma ụlọikpe maka ebubo iji aghụghọ nweta ihe, ohi na ime akwụkwọ adịgboroja nke e kwuru na o mere bido na afọ 2009 rue 2011. Mana Innoson na-ekwu na ụlọegọ GTBank nke ha na ụlọọrụ ya nwere esemokwu azụmahịa bụ aka enwe dị na ofe ahụ.