Ramaphosa na-ekwusizi ka ọndụ Zuma ọ Kwapụkwapụ

Onyeisi ANC bụ Cyril Ramaphosa Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ramaphosa ga abụ onyeisiala ma Zuma rituo

Uwa agbala ANC gharị maka ihe ha na Jacob Zuma ga eje maka nchụda ha chọrọ ị chụda ya n'oche ọchịchị mba South Africa.

Osote onyeisiala bụ Cyril Ramaphosa sịrị na ya bụ ihe bụ odudu bere na njọ, "a ga akpachapụ anya egbu ya".

"Ama m na unu chọrọ ka ọ bee nke taa n'echị". Ihe ka Ramaphosa zara ndị biara nchete ọmụmụ narị afọ Nelson Mandela.

Ebụbọ mpu na aghụghọ a na ebọ Zuma karịrịakarị kemgbe ọ rigoro ọkwa ọchịchị afọ itọlị garaaga.

African National Congerss sịrị na ndị isi ha ga ezukọ ụbọchị Monday (12-2-18) ị kpabị isiokwu gbasara Jacob Zuma.

Onye nta Akụkọ BBC bụ Andrew Harding na-eche na ndị isi ahụ ga a si Zuma rituo ngwangwa.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo A na-atụ onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Jacob Zuma aka gbasara mpụ na nrụrụaka