Ellen Sirleaf eriela nde dollar ise na ọkwa Mo Ibrahim

Ellen Sirleaf Johnson na George Weah Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ellen Sirleaf Johnson bụ onye ise na-eweta ọkwa Mo Ibrahim na Afịrịka

Onye na chibụ Liberia bụ Ellen Johnson Sirleaf eriela nde dollar ise site na ọkwa a na-akpọ Mo Ibrahim prize for African Leadership na asụsụ bekee.

Oriakụ Sirleaf rituru na ọkwa ka onyeisiala Liberia n'ọnwa gara aga. Ọ bụ ya bụ nwaanyị izizi meriri ntụlika onyeisiala na Afrịka mgbe ọ pụtara ka onyeisiala Liberia n'afọ 2006.

E toro Sirleaf maka ọrụ ọ rụrụ eji rụgharịa Liberia ka agha biri na mba ahụ.

Ndị na ahụ maka ọkwa Mo Ibrahim kwetere na agbanyeghị na ana ebo Sirleaf ebubo na o meghị ihe okwesiri ime maka na mpụ na awuwo, o gosiri ọchịchị pụrụ iche na mgbe na-adịghị mfe.

Ndị a si na ọ sọ Liberia gosiri ọganiru n'ime mba 54 enebanyere anya maka ihe akpọrọ Ibrahim Index of African Governance na asụsụ bekee.

Oriaku Sirleaf rụrụ onyeisiala ụgbọrọ abụọ, mana o soro zọ ọchịchị nke emechara n'afọ a, bụ nke onye bụbụ onye egwuregwu bọọlụ George Weah meriri.

Na ntụli ahụ, ndị otu ya na ebo ya ebubo na ọ hapụrụ onye nke ha wee kwadọ Weah. Ha chụrụ ya na pati ahụ ụgbụa.

Sirleaf bụ onye ise na enweta ọkwa Mo Ibrahim kemgbe 2017.

Eji ọkwa Mo Ibrahim atu ndị ọchịchi mba Afịrịka mere ọfuma mgbe ha nọ n'ọkwa.

Isiokwu Ndị Emetụtara