Sirleaf: Ihe ntunyeugo pụtara

Ellen Johnson Sirleaf Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ellen Johnson Sirleaf bụ nwaanyị mbụ meriri ntụlika onyeisiala na Afrịka

N'akwụkwọ ọ gupụtara mgbe e nyere ya nturuugo ahụ, onyeisioche, Kọmiti nzere ahụ bụ Dkta Salim Ahmed Salim, kwuru sị:

"Ellen Johnson Sirleaf were ọchịchị mba Liberia mgbe agha mebichara ya ma duo ya na ikpa udo n'ime ka ọchịchị onyekwuoucheya tọ atọọ.

Oge niile ọ nọ n'ọchịchị, ọ rụrụ ndị ọha Liberia ọrụ. Njem a abụghị ihe enweghị ntụpọ ọbụladị na Liberia. Na afọ iri na abụọ ndị ahụ, Ellen Johnson Sirleaf tọrọ ntọ anị a ga eji wulite Liberia."

Nke a bụ nke isii n'ime ugboro iri mmadụ na-enweta nturugo Ibrahim maka ọchịchị e ji ama atụ n'Afrịka.

Kọmiti na-ahụ maka nhazi ntunyeugo nke Ibrahim kwukwara na "Sirleaf were ọchịchị n'obodo alụrụ ọgụ afọ iri ana anọ ma gosipụta ọchịc wetara mgbanwe."

Na nkọwa ya, onye ọkacharamara n'ihe gbasara ọchịchị na Afrịka bụ Sam Olisa gwara onye ntaakụkọ BBC na nkwanyere ugwu a e nyere Sirleaf "bụ ezi ihe maka ikwalite ọchịchị onyekwuucheya n'Afrịka."

"Echere m n'ihe mere Sirleaf ji nweta nzere a bụ maka n'ọ haziri ntụliaka nke onye pati ọzọ meriri, ọ ma hanye ya ọchịchị n'aka."

"Echere m na ọ bụ ezigbo akara n'ihi na e wezụga ntunyeugo ahụ, o riterekwara nde dola ise nke ọ ga-erite afọ iri. Mgbe nke gachara ọ ga na-eri puku dola nari abụọ ndu ya niile.

"Nke a ga-enyere ya aka ilekọta onwe ya nke ọma, ma kpalite mụọ ndị ndụ na Afrịka ịmata na ha kwado ọchịchị onyekwuuche ya, na ha chịcha, ha ga-enweta nzere ma nwekwa enrite ego."

E wezụga Sirleaf, mmadụ ise ndị ọzọ e nwetala ntunyeugo nke Mo Ibrahim nke edebere maka kwanyere ndị isiala n'Afrịka kwadoro ọchịchị onyekwuocheya na ikike dirioney n' ala ha na agbanyeghị ihe isi ike.

Ndị nwetara ntunyeugo Mo Ibrahim prize kemgbe o bidoro gunyere:

  • 2007: Onye bụbu onyeisiala mba Mozambique bụ Joaquim Chissano
  • 2008: Onye chiburu Botswana bụ Festus Mogae
  • 2009: Onweghị onye nwetara ntunyeugo ahụ
  • 2010: Onweghị onye nwetara ntunyeugo ahụ
  • 2011: Onye bụbu onyeisiala mba Cape Verde bụ Pedro Verona Pires
  • 2012: Onweghị onye nwetara ntunyeugo ahụ
  • 2013: Onweghị onye nwetara ntunyeugo ahụ
  • 2014: Onye chiburu mba Namibia bụ Hifikipunye Pohamba
  • 2015: Onweghị onye nwetara ntunyeugo ahụ
  • 2016: Onweghị onye nwetara ntunyeugo ahụ

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na igwe okwu Twitter maka nzere: