Imo Steeti: A zọwala ọkwa ọche Gọvanọr?

Rochas mere nwanne ya nwaanyị onye Kọmishịọna na-ahụ maka obi ụtọ nke Imo Steeti Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rochas mere nwanne ya nwaanyị onye Kọmishịọna na-ahụ maka obi ụtọ nke Imo Steeti

Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ ga-akwado ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu maọbụrụ na ọ pụta ịzọ ọkwa ọchịchị govanọ nke Imo Steeti n'afọ 2019.

O kwuru nke a mgbe ndị otu Pati APC n'akwa ndị ọzọ si na mpaghara Owerri Manucipal bịara n'obi ọchịchị ya dịna Owerri gwa ya ka ọ kwadọ Uche Nwosu ịzọ ọkwa Gọvanọ Imo Steeti n'afọ 2019.

Gọvanọ kwuru na Uche Nwosu agwabeghi ya na ọ chọrọ ịzọ ọkwa Gọvanọ, ma kwuo na ọ ga-akwado ya mgbe ọbụla ọ dị na njikere ịzọ ọkwa Gọvanọ.

Ọ kọwara ya dịka onye ezịokwu na-adịghị akpa oke ọ bụla.

"Uche bụ onye na-etinye uchu n'ọrụ ike adịghị agwụagwụ, ọ bụ nwoke dị umeala, ọ na-aghị akparị mmadụ."

Akụkọ kwuru na ụfọdụ ndị Imo Steeti na-akwadọ onye osote Gọvanọ bụ Prince Eze Madumere ka ọ bụrụ onye ga-anọchị anya Rochas n'afọ 2019.

Cheta na izuụka gara aga, Onye bụbụ Gọvanọ Imo Steeti bụ Ikedi Ohakim kwuputara uche ya n'ịzọ ọkwa ọzọ n'afọ 2019.

Ebe ọkatọrọ Okorocha maka iji ndị ọkaikpe Imo Steeti ọtụtụ ọnwa.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionImo Steeti: A zọwala ọkwa ọche Gọvanọr?

Mgbe ndị BBC gbara otu onye ọka n'okwu ndọrọndọrọ ọchichi bụ Obi Joe ajụjụ ọnụ.

Okwuru na Okorocha nwereike ịkwado onye ọbụla ọchọrọ maka ịzọ Gọvanọ na ihe ndị Imo chọrọ bụ onye ga-achị nkeọma.

O kwukwara na ọ bụrụ Uche Nwosu, Eze Madumere, Ikedi Ohakim maọbụ ndị ọzọ pụta ịzọ ọkwa Gọvanọ na ọ dị ndị Imo Steeti n'aka ịhọpụta onye ha chọrọ.

Joe kwuru na dịka ihe ụdị mkparịta ụka otu pati dị icheiche n'enwe ugbua, na ọ dịka agha onye ga-abụ Gọvanọ Imo Steeti n'afọ 2019 amalitela.