Buhari na ndị isi otu APC enwela mkparịta ụka

Nke a bụ nke abụọ Buhari na ndị ndu APC na-enwe mkparịta ụka n'ime afọ 2019 Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nke a bụ nke abụọ Buhari na ndị ndu APC na-enwe mkparịta ụka n'ime afọ 2019

Onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari na ndị ndu pati APC gunyere Bisi Akande, Bola Almed Tinubu enwela mkparịta na Aso Rock dị na Abuja.

Tupu ha amalite, Buhari na onye bụ buru onyeisiala bụ Abdulsalami Abubakar buru ụzọ nwe mpkarịta ụka ndị were nkeji 25.

Abdulsalami ekwughi ihe mere ojiri bịa n'AsoVilla maọbụ ihe isi nzukọ ha bụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Tinubu bụ onye Gọvanọ Lagos Steeti n'oge gara-aga

Na tufughi oge Abdulsalami lara, Akande na Tinubu wuchiri n'obi ọchịchị.

Akụkọ kwuru na ihe mere ha jiri bịa bụ maka ọrụ Buhari nyere Tinubu ka o mee udo n'etiti ndị otu pati APC nwere esemokwu.

Ebe akụkọ ọzọ kwuru na ọ bụ maka akwụkwọ ozi ndị bụrụ ndị isiala bụ Olusegun Obasanjo na Ibrahim Babangida zigara gwa ka o wepụ anya n'ihe gbasara ọchịchị n'afọ 2019.

Onye ọka mmụta bụ Wole Soyinka katọrọ onyeisiala Buhari kwuo na ọ na-arọ nrọ mere na ọ maghị ihe n'eme gburugburu ya.

Rue mgbe akụkọ bịara onweghi onye mara ihe ha kparịtara n'ụka.

Cheta na ihe bụ nke abụọ ndị a na-enwe mkparịta ụka n'ime afọ a.