Ọkwa ọnwụ: Morgan Tsvangirai

Morgan Tsvangirai 2002 Image copyright AFP

Morgan Tsvangirai, bụbụ onye ọrụ ngwuputa ihe n'ala na onye isi ndị otu ahịa, bidoro otu akpọrọ Movement for Democratic Change (MDC) n'afọ 2000 nke mere o ji bụrụ onye kacha mee ọfụma n'ịma aka n'ihu kemgbe mba Zimbabwe ji nọọrọ onwe ha.

Kama, onweghi ohere ime ihe ọbụla maka na Robert Mugabe ekweghị aritu n'ọkwa, ọ bụ ezie na ọ rụrụ ọrụ dịka praịm mịnịsta n'ime gọọmentị ndịnotu, na-eso mbinyeaka agbaghara agbagha na 2008.

N'ime ọchịchị, onweghi mgbanwe ọbụla kwere ya omume, kama o so gbaa mbọ ịhụ na-achụturu Mugabe n'afọ 2017.

Site n'ọrụ ngwuputa ihe n'ala banye onye isi ndị na-ama aka:

Image copyright AFP
  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri nke Maachị 1952 n'obodo Gutu - ọ bụ otu n'ime ụmụ itoolu onye kapịnta mụrụ
  • Hapụ ụlọakwụkwọ gaa mụta ịkpa akwa, mechaa gaa ịrụ ọrụ ebe a na-egwu ala
  • Banyere n'ime ọrụ otu; banye n'ọkwa ezekutiv ndị na-egwu ala akpọrọ National Mine Workers Union n'aha bekee
  • Ka ha bidoro ịbụ mba nọọrọ onwe ha n'afọ 1980, ọ banyere pati nọ n'ọchịchị Zanu-PF, bụrụ onye ọkwa ya gbagolitere
  • Na 1988, ọ bụrụ onyeisi ndị otu Zimbabwe Congress of Trade Unions (ZCTU)
  • N'ọnwa Disemba 1997 na mbido 1998, ZCTU du ndị mmadụ ime abụbọ ọrụ maka ụtụisi ebuliri
  • Ndị ZCTU tinyere aka ịhụ na ebidoro otu MDC n'ọnwa Septemba 1999
  • N'afọ na-eso ya, pati ahụ zọtara oche ọchịchị 57 - ịbụ ndị ịma aka kacha mma n'akụkọ Zimbabwe.

Onye ọ ga-abụ okwuo okwu ọha egere olu ya, Tsvangirai na ndị otu MDC mere ka pati ha na-amasị ndị ntorobịa ọgbaraọhụrụ Zimbabwe ndị usoro otu pati na akụnaụba ọjọọ obodo ha gwụrụ ike.

Mana Mugabe kwuru sị na MDC bụ otu ndị gọọmenti UK na ndị ọrụugbo ndị ọcha na-apị ka nwa bebi, n'agbanyeghị na ha nwere ndị na-arụ ọrụ oyibo ụkwụ siri ike.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Tsvangirai enweghị ike igbochi ihe ike si n'aka ndị gọọmentị ha mara aka n'ihu

N'etiti 2000, Tsvangirai bịara bụrụ njirimara ndị na-achọghị ọchịchị nka na ichi-ọnụ-n'ala nke Mugabe - anwụchiri ya, kụọ ya ihe ma bo ya ebubo ịgba ọchịchị mgba okpuru nke bekee kpọrọ treason, ọtụtụ oge.

N'agbanyeghị na a ahụtara ya dịka onye n'alụchitere ndị emegburu emegbu ọgụ, ụfọdụ ndị ha na Tsvangirai jikọrọ aka boro ya ebubo ime ka onye ọchịchị aka ike kwa mgbe.

Ọ kagburu mkpebi ndị isi MDC isonye na mbinyeaka nke sineeti n'afọ 2005, ma sịkwa ndị mmadụ apụtala.

Nke a butere nkewa n'etiti pati ma wepụ ohere ya iji achutu Mugabe n'oche.

N'afọ 2007 anwụchikwara Tsvangirai ọzọ, nke ugbua, akpọgara ya n'ebe obibi ndị agha pụrụiche (special forces barracks) ebe akụrụ ya ezigbo ihe ruo elekere ole na ole, kpatara okpokoroisi ya jiri waa ma mekwaa ka ọbara n'agba ya n'ime ahụ.

Akpọgara ya ụlọọgwụ ebe otu onye ose foto akpọrọ Edward Chikomba, zoro ezo sere foto ya tinye n'ihe onyonyo, mere eji si na Zimbabwe zopu ya.

Emechara tọrọ ma gbuo Chikomba.

Keonwe na nke pọlitiks

Image copyright AFP
  • Akụkọ kọrọ sị na ọnwụghị n'agbanyeghị na-anwara igbu ya ugboro atọ, gụnyere otu n'afọ 1997 ebe achọrọ isi na mpio dị n'agba nke iri n'ụlọelu ebe ụlọọrụ ya dị tụpụ ya
  • Ndị kwudoro ya ma ya site n'aha obodo ya bụ "Save"
  • Ya na Susan nwunye ya nke mbụ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ n'afọ 2009 ka emechara ya praịm mịnịsta, mụtara ụmụ isii
  • Mugabe kpọrọ ya "onye amaghị ihe" maka na amụnyere ya n'ime ụbịam ya na maka n'ọgaghị akwụkwọ
  • O kwuputara na o nwere kọlọn kansa n'ọnwa Juun 2016.

N'ọnwa Maachị 2008 ọ zọrọ ọchịchị onyeisiala ma nwetekwa ntuliaka kacha, mana dị ka akwụkwọ mpịakọta kwuru, ozughi inye ya mmeri ziri ezi.

Tupu ebido agba nke abụọ nke emere na Juun, ndị nchekwa Mugabe busoro ndị na-ama ya aka n'ihu agha, mere ka Tsvangirai kwụsị.

Akpọpụtara aha Mugabe dị ka onye meriri, mana ndị mba ụwa were iwe gbasara ebubo ihe ike na nrụrụaka gbasara ntuliaka nke butere mkpebi ike ọchịchị na ka ọtụtụ ọnwa gachara ebe a na-enwe mkparịtaụka, ka akụnaụba obodo ha dara, Tsvangirai bịara ṅụrụ iyi ọrụ praịm mịnịsta n'ọnwa Febrụwarị 2009.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo N'agbanyeghị ọchị ya Mugabe ekweghị eke ọchịchị

Ọtụtụ mpaghara ndị MDC ekweghị ṅụọ mmiri tọgbọ iko, ha sị na ọ bụ mkpebi ya ike ọchịchị mere ka Mugabe ka nwee ike ịnọ n'ọchịchị

Onweghịkwa ike iguzogide Mugabe n'ihe kwesịrị ịbụ njikọaka ha otu, nke mere ka onyeisiala onye oke amamihe na-etinye iwu etu osi masị ya ka a na-aga n'ihu.

Nke a mere ndị mmadụ ji enweghị ntụkwasịobi n'ime ọchịchị Tsvangirai, nke mechara bute ezigbote mmeri emeriri MDC na ntuliaka e mere n'ọnwa Julaị 2013.

Naanị ka ọnwa abụọ gara, Tsvangirai gbara ọrụ praịm mịnịsta arụkwaghị m, mana Mugabe kagburu ọkwa ọchịchị ahụ iji gosi na onweghị ọdị ikike ahụ.

Tsvangirai dị ndụ hụ ka achụturu onyeisiala otere aka ya na ya lụwara - n'ezie ọ bụ aka ndị agha tinyere mere ka Mugabe rituo n'ọkwa ọchịchị.

Kama, ọtụtụ ndị Zimbabwe ga-echeta Tsvangirai dịka dike ọrụ, onye mbuso agha ya nye ọchịchị onye-kwuo-uche-ya kpalitere ọgwụgwụ oge ọchịchị Mugabe.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a