Uweojii Israel sị na Netanyahu tinyere aka na mpụ

Benjamin Netanyahu onyeisiala mba Israel Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Netanyahu sị na ya kwụsị ike maka ebubo a na-ebo ya bụ asi

Ndị uweojii n'Israel sị na onyeisiala ha bu Benjamin Netanyahu kwesiri iza aziza maka ebubo na aka ya dị na mpụ.

Ozi ndị uweojii Israel zipụrụ n'akọwa na ha nwere aka ebe goziri na Netanyahu tinyere aka na mpụ na awụwọ n'okwu abụọ.

Mana, n'okwu okwuru na ihe onyonyo, Netantahu sị n'ebubo a enweghị atụ, na ya ga-anọdụ ka onyeisiala Israel.

Okwuru n'ebubo ndị a "ama pụta ihe obuna".

Ihe eboro Netanyahu

Otu n'ime ebubo a na-akọwa na Netanyahu gwara onye nwe ọlụ nta akụkọ a na-akpọ Yediot Aharonot ka o de akụkọ ga amasi ya. Netanyahu kwere nkwa na ya ga pichi ụlọ nta akụkọ ọzọ so Yediot Aharonot azọ ahia iji kwụhachị ụgwọ mpu a ọchọrọ ka emere ya.

Uweojii Israel si na onye isi Yediot Aharonot bụ Arnon Mozes kwesiri iza aziza.

Ebubo nke abụọ na-atụ aka na Netanyahụ, bu onyeisiala mba Israel kemgbe afọ 2009, natala onyinye rụrụ nde shekel (naira nde 93840000) na aka Arnon Milchan bu onye na eme ihe nkiri na Hollywood ama ama nakwa ndị ọzọ.

Ụlọ nta akụkọ Jerusalem post si na onyinye ndị a bụ mmanya Champagne, Ciga bu ihe enyere Netanyahu maka na onyere Milchan aka weta akwukwọ ojiri ga mba Amerịka.

Ndị uweojii n'Israel si na Milchan kwesiri iza aziza maka ihe a.

Isiokwu Ndị Emetụtara