Ndị Uweojii awakpola be enyi Zuma

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị South Afịrịka na-eme ngaghari iwe maka ukwu ndị be Gupta ha si ndị na gọọmentị ha

Ndị uweojii pụrụ iche na mba Saut Afịrịka awuchiela be Gupta na obodo ahụ.

Ndị be Gupta bụ ndị a na ahụ ka ndị ha na onyeisiala mba Saut Afịrịka dị na ezigbo mma.

Onye na ekwuchitere gọọmentị Saut Afịrịka bụ Hangwani Mulaudzi siri na ogụga ndị uweojii gara be Gupta bụ maka nyocha ha na-eme banyere mpụ mere na gọọmentị Zuma.

Ndị na hụchata mpụ na aghụghọ na ala ahụ nke akpọrọ public anti-graft watchdog na asụsụ bekee, boro ndị be Gupta ebubo na ha ji ọyị ha na Zuma jiri kpa ego.

Ha na agọ, si na onweghị ihe ha mere.

Onyeuweojii nọ na be Gupta ha gbọchiri ụzọ e si eje ebe ahu, ma kwuo na ọ bụ "ebe akpara arụ."

Zuma nọ na ezigbote nsogbu ka ndị pati ya bu ANC na-akwenye ya ọku n'ike ka ọ rituo na ọchịchị.

Isiokwu Ndị Emetụtara